Ụbochi ụmụnwaanyi

0
14

ABALI asatọ n’ọnwa atọ ahọ ọbụla bụ ụbọchị ụmụnwaanyị n’ụwa niile. Ọ bụ ụbọchị e ji echeta uru, ọlụ, inyeaka, echiche nakwa ezi uche ụmụnwaanyị n’ụwa niile.

  Ọ bụghị icheta ha dịka ndị nwuru anwụ kama dịka ndị bara uru na ndị dị mkpa. Umụnwaanyị na e jikwa ụbọchị ahụ egosi na nwaanyị bụ ihe na onye na-agụpụ ha bụ onye iro.

  N’ezie, nwaanyị bara nnukwu uru n’oge ugbu a malite na ezinaụlọ ruo na obodo ọbụlaị na ụlọụka. Dịka isi okwu nke ụbọchị ụmụnwaanyị nke ahọ siri iwepụ ịkpa oke n’etiti nwoke na nwaanyị (Time to break the bias).

  Isi okwu nke ahọ a gbara nnukwu ọkpụrụkpụ maka na ịkpa oke na adọghachi aka elekere azụ maka na ọ bụ otu ụlọakwụkwọ ka nwoke na nwaanyị na-aga. Ha jee kampụ NYSC, otu ọzụzụ ka a na-enye ha, otu ụgwọ akwụkwọ ka ha na-akwụ. Ọ bụ gịnị meziri ewebe ọlụ, a na-ahụ nwaanyị dịka ndị agaghị alụ ọlụ dị ańaa.

  Ụbọchị ụmụnwaanyị bụ ụbọchị ewepụtara iche ị ji mee ka ụmụnwaanyị niile mara na ha bụ ihe. E jikwazi ụbọchị ahụ akpọpụta ụmụnwaanyị ndị kwụputara iche na mba ụwa ndị na agba mbọ n’ọlụ ha nakwa ịzụahịa ha. Ọ bụkwazi oge e ji eme ka ụmụnwaanyị mara ihe ha kwesịrị ịmara site na nkuzi na okwu dị iche iche a na-enye ụbọchị ahụ.

  Ọ bụkwa oge ha ji atụ ụtụ uche na amamihe ị me ka ndị niile bụ nwaanyị mara na ha bụ ìhé. Nanị ihe ọ ga ewe ha bụ ịgba mbọ ka ụmụnwaanyị bilie were ọnọdụ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here