Akpụkpọ ụkwụ na uru ọ bara

0
12

AKPỤKPỌ ụkwụ bụ ihe e ji ekpuchi ụkwụ nke zuru ụwa ọnụ. Ma okenye ma nwata na-agba akpụkpọ ụkwụ n’ihi na ọ dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ.

  Akpụkpo ụkwụ na-eme ka mmadụ ghara inwe mmerụ ahụ n’ụkwụ n’ihi na ọ na-ekpuchi ụkwụ nke ọma site n’okpuru ruo n’elu. Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ibute nje dị iche iche juru n’ala. Ọbụladị ọkụ na-ere n’ala ma anwụ na-acha, akpụkpọ ụkwụ na-eme ka ọ ghara ire mmadụ.

  N’ihi uru akpụkpọ ụkwụ bara, ndị mmadụ na-agba ya ụdị dị iche iche dịka oge siri gbata kwụrụ. Ịmaatụ: Akpụkpọ ụkwụ a na-agba n’udu mmiri dị iche na nke a na-agba n’ọkọchị. E nwekwara nke e ji egwu mmiri, ọ na-esite n’ala ụkwụ ruo n’ikpere. Mmiri anaghị emetụ onye ọbụla gba ụdị akpụkpọ ụkwụ a. Na mba ndị ọcha yaabụ ala bekee, n’ihi oke oyi, o nwere oge ọkpụrụkpụ oyi (snow) ji esi n’elu na-ada na be ha. Ya mere, n’oge dị otu ahụ, ha nwere ụdị akpụkpọ ụkwụ pụrụ iche ha na-agba iji nyere ndụ ha aka.

  Ndị mmadụ jikwa akpụkpọ ụkwụ achọ mma. N’ụzọ dị otu ahụ ha na-eyi ya ka ọ dabaa n’ihe ụwa chọrọ. Ọ bụ ya mere mgbe ụfọdụ otu ụdị akpụkpọ ụkwụ a na-ewu, onye ọbụla ị hụrụ ọ gbara ya n’ihi na ụwa na-achọ ihe na-ewu ewu.Ha na-agbakwa akpụkpọ ụkwụ ka ya na akwa ha yi n’ahụ gakọọ ka ha wee maa mma ile anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here