Mkpa ọ dị ka Soludo gbado anya na nchekwa

0
13

DỊKA gọọvanọ Soludo n’abata, otu n’ime ihe mbụ ọga eleba anya bụ ọlụnche. Ọlụnche bụ nnulwu ọlụ dị oke mkpa ma bụrụ ọlụ kwesiri ka onye ọchịchị ọ bụla buru ya n’obi ma leba anya na ọlụ ahụ nke ọma.

  O kwesịrị ka ọ bụrụ ndị hụrụ obodo ya na ndị ọzọ n’anya ka a ga-enye ya bụ ọlụ. Ọlụnche a bụghị ọlụ e ji egwu egwu chachaa. Akwụkwọ Nsọ kwuru na akwụkwọ Ezikel, isi iri atọ, amaokwu atọ, usoro nke abụọ ruo nke ise, maka onye nche, ọlụ ya na ụgwọọlụ ya. Nke a na-egosi uru ezi nchekwa bara n’obodo. Ọzọ, ọlụche abụghị onye ga-egbukpoo n’ọhịa ọ pụta jụọ onye na-egbu.

  Ọchịchị obodo abụghị ihe siri ike kama ọ bụ ndị a na-achị na-eme oge ụfọdụ ọ dịka ọ bụ ihe siri ike. Oge ụfọdụ onye ọchịchị e buru ezigbo ihe n’obi mana ndị nọ ya gburugburu eduhie ya ime ihe a ga-eji kpọ ya aha ọjọọ. Ndị ndụmọdụ ọjọọ a dịghị ekwe ya mee ezi echiche ya. Eziomume abụghị ihe egwu nye iwu kama ọ bụ egwu nye ajọ omume.

  Dịka aka na-achị obodo bụ Ọkammụta Charles Soludo na abata, ka ọ gbaa mbọ ileba anya na ihe gbasara nche. Ihe okwu a jiri pụta ugbu a bụ na ndị Igbo siri na emeE ngwa, emeghara ọdachi. Onye ọchịchị ọbụla maara ị chekwa ndụ, akụnụba nakwa ngwongwo ndị mmadụ ga-abụ onye a na-eweliliaka ma bụrụkwa ọ dị n’obi ọtụtụ mmadụ.

  Dịka Ọkammụta Soludo na abata I weghara ọchịchị Anambra, ọ bụrụ na o were ụtụtụ a chụọ ewu ojii, ọ ga-eme ka e nwee udo nke obi ma nwekwa udo n’obodo. I nwe ezi nchekwa obodo ga-eme ka ndị ji ego bata nye aka na mmepe obodo. Ọ gaghị abụ naani mgbe gọọmenti jiri weta mmepe, gọọmenti kpọọ oku, ndị ji ego aza ha. A gaghị atụ egwu ị bata obodo.  

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here