N’Anambra, ndị uweojii ejidela dibịa na ndị ọzọ maka otu nzuzo na ịgbà nwaanyị ọtọ

0
11

 NDỊ uweojii na steeti Anambra anwụchiela mmadụ asaa a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo, ndị soro wee gbàá otu nwaanyị ajadụ ọtọ n’Agụleri na nsonso a, nàkwà ndị na-etinye aka na mpụ na arụrụala ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ.

  Ndị omekoome ahụ bụkwa ndị a kpụgharịrị ụbọchị Wenezdee n’isi ụlọọrụ ‘Criminal Investigation Department (CID)’ nke isi ụlọọrụ uweojii steeti ahụ dị n’Amawbia, n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Awka South’ site n’aka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng.

  N’okwu ya oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ, CP Echeng mèrè ka a mara na ndị ahụ gụnyèrè ótù nwoke gbara ahọ iri anọ na anọ, bụ Maazị Anthony Obanye, bụkwa onye a na-enyo enyo na ọ bụ dibịa.

  Dịka o siri kọwaa, ndị omekoome ndị ọzọ ahụ e jidere gụ̀nyèrè Maazị Udalor Egwuatu Nnalue (gbárá ahọ iri anọ na isii), Maazị Godwin Ezechukwu (gbara ahọ iri anọ na abụọ), Nonso Ezechukwu (gbara ahọ iri abụọ), Philomena Onyekwe (gbara ahọ iri abụọ na asaa), tinyere Chineyere Mmachi (gbara ahọ iri atọ na abụọ).

  Ọ kọwagasịrị ụfọdụ ebe dị icheiche ndị omekoome kpara mkpamkpa na nsonso a, ma nyekwa nkọwa banyere arụrụala dị icheiche ha rụrụ na mpaghara ebe dị icheiche n’ime steeti ahụ, nke gụnyere ebe a kwara ozu n’Ebenebe dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka North’, bụ́ ebe a gbagbusiri ndị gara akwamozu; mpaghara ‘Unizik Junction’, bụ ebe a gbagburu onyeisi òtù jikọtara ndị Keke; Ifite Awka, bụ ebe ndị omekoome na ndị ọrụ nchekwa kwàrà mgbọ; Agụleri, bụ ebe a gbàrà otu nwaanyị ajadụ ọtọ, sèé ya onyoonyoo, ma bokwa ya ebubo na o gburu di ya; tinyere ọtụtụ ebe ndị ọzọ ọ kpọpụtasịrị.

  O mere ka a mara na ihe dị icheiche e nwetegasịrị n’aka ndị ahụ gụnyèrè ụdị egbe dị icheiche, anyike, ọtụtụ mgbọ egbe, ụgbọala Benz V-Booth (nwere ákàrà efere Lagos HC 661 AAA), ọgwụike dị icheiche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Dịka ọ na-ekele ndị Anambra maka inye ndị uweojii ozi dị mkpa ná-ényére ha aka n’ọrụ ha, ọ rịọkwazịrị ha ka ha gaa n’ihu ime nke ahụ.

  CP Echeng kwèzịrị nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyòcha banyere okwu ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here