N’Anambra, Soludo amalitela ọchịchị

0
10
Ọkammụta Soludo (n'aka nri) oge Chiifu Willie Obiano (n'aka ekpe) dughárίchárá ya n'obi gọọmenti dị n'Awka, na nkwadobe maka nnyefe ọchịchị

Ọ NA-ADỊ mma a sụgide ụtara e hogharịa ọdụ. Igbo sị̀kwa na ihe ọbụla nwere mmalite gà-enwerịrị ọgwụgwụ ka ọzọ wee malite.

  Ka ọ dị taa, bụ Tọọzdee, abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ, Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo amàlitéla ọchịchị n’ùjú dịka aka na-achị steeti Anambra.

  Ọchịchị ya bụ nke ọ na-amàlite ozigbo dịka aka chịpụ̀rụ̀ steeti ahụ ugbua, bụ Maazị Willie Mmadụabụrọchukwu Obianọ na-arịtu n’ọkwa taa, ka ọ chịchara steeti ahụ ahọ asatọ zuru òkè, malite n’abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ puku abụọ na iri na anọ, wee ruo taa.

  Soludo, onye ọchịchị ya malitere taa, bụ onye a họpụtara dịka Gọvanọ steeti ahụ, ná nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti ahụ n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ gara aga, n’okpuru ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Alliance (APGA); ebe osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim bụ onye a họpụtara dịka osote ya.

  Ọ dị ncheta na steeti Anambra enwebụọla ndi ọchịchị dị icheiche malite na mgbe e kepụ̀tara ya n’ahọ 1991 wee ruo taa, ma n’ọchịchị ndị agha, ma ọchịchị ndị nkịtị. Ndị ahụ nà oge ha malitere n’ọkwa ọchịchị gụnyere: Joseph Abulu (Ọgọstụ 27, 1991), Gọvanọ Chukwuemeka Ezeife (Jenụwarị 2, 1992), Dabo Aliyu (Nọvemba 1993), Mike Attah (Disemba 9, 1993), Rufai Garba ( Ọgọstụ 21, 1996), Emmanuel Ụkaegbu (Ọgọstụ 6, 1998), Gọvanọ Chinwoke Mbadịnuju (Mee 29, 1999), Gọvanọ Chris Ngige  (Mee 29, 2003), Gọvanọ Peter Obi (Maachị 17, 2006), Gọvanọ Virginia Etiaba (Nọvemba 3, 2006), Gọvanọ Peter Obi Governor (Febụwarị 9, 2007).

GUO:  Soludo eduola mmadụ anọ ọzọ n'iyi ọrụ

  Taa, Willie Obianọ, onye banyere n’ọkwa n’ahọ 2014, esonyekwala n’ọnụọgụgụ ndị Gọvanọ chịbụrụ Anambra; ebe Ọkammụta Soludo baghàràzịkwara oche ahụ ma banye n’ọkwa, dịka o siri bụrụ ọchịchọ ndị Anambra.

  Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo bụ onye a mụrụ n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị ahọ 1960, ma bụrụ onye obodo Isuofia dị n’okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra.

  O nwetere nzèré Digrii (n’ahọ 1984), Mastas (n’ahọ 1987), na PhD (1989) ya n’ihe ọmụmụ Economics na Mahadum ala Nigeria dị na Nsụkka, ma bụrụkwa nke o jichà nzere ‘First Class’ wee pụta na ha niile, nwetekwa nturugo dịka nwata akwụwkwọ kacha mee nke ọma n’ogoogo nzere atọ ahụ.

  O jiela ọtụtụ ọkwa dị icheiche, nke gụnyere: Nnukwu onye ndụmọdụ nyegara onyeisi ala Nigeria n’oge mbụ, bụ Olusegun Obasanjo n’ihe gbasaara ọnọdụ akụnụba; onyeisi ụlọọrụ ‘National Planning Commission of Nigeria’; onyeisi òtù ‘Economic Advisory Council (EAC)’; onyeisi ụlọ ọba ego ala Nigeria, bụ ‘Central Bank of Nigeria’; onyeisi òtù ọrụ ‘Anambra Vision 2070’; tinyere ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ o jigoro n’ogoogo dị icheiche, ma n’ala Nigeria ma na mba ofesi; tupu ụmụafọ steeti Anambra họpụtazie ya ka o jere ha na steeti ya ozi dịka Gọvanọ. Ije ozi ahụ pụrụ iche bụkwazị nke ọ malitere n’uju taa.

  Ọ bụkwazị olileanya ndị Anambra na mba ụwa n’izugbe na ọ ga-eme nke ọma n’ọkwa ọchịchị ahụ karịa ka o mere n’ọkwa ndị ọzọ dị icheiche o jigoro n’oge mbụ. Mana nke ahụ chọ̀rọ̀ nkwàdó ọhaneze, iji mezupụ̀ta ya, maka na ótù osisi anaghị eme ọhịa. Ọ bụkwa aka wèté aka wèté, àkpà èjú.Ezi ọchịchị ọbụla chọrọ ezi nkwàdo.

GUO:  Nnọọ n’oche eze Anambra Ọkammụta Soludo

  Ndị Anambra, Soludo awụ̀chiela.

  Soludo, nnọọ!

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here