Ndị ọmeiwu Anambra asịla Obianọ ‘jee nke ọma

0
11
NDỊ uweojii na steeti Anambra anwụchiela mmadụ asaa a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo, ndị soro wee gbàá otu nwaanyị ajadụ ọtọ n'Agụleri na nsonso a, nàkwà ndị na-etinye aka na mpụ na arụrụala ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ. Ndị omekoome ahụ bụkwa ndị a kpụgharịrị ụbọchị Wenezdee n'isi ụlọọrụ 'Criminal Investigation Department (CID)' nke isi ụlọọrụ uweojii steeti ahụ dị n'Amawbia, n'okpuruọchịchị ime obodo 'Awka South' site n'aka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng. N'okwu ya oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ, CP Echeng mèrè ka a mara na ndị ahụ gụnyèrè ótù nwoke gbara ahọ iri anọ na anọ, bụ Maazị Anthony Obanye, bụkwa onye a na-enyo enyo na ọ bụ dibịa. Dịka o siri kọwaa, ndị omekoome ndị ọzọ ahụ e jidere gụ̀nyèrè Maazị Udalor Egwuatu Nnalue (gbárá ahọ iri anọ na isii), Maazị Godwin Ezechukwu (gbara ahọ iri anọ na abụọ), Nonso Ezechukwu (gbara ahọ iri abụọ), Philomena Onyekwe (gbara ahọ iri abụọ na asaa), tinyere Chineyere Mmachi (gbara ahọ iri atọ na abụọ). Ọ kọwagasịrị ụfọdụ ebe dị icheiche ndị omekoome kpara mkpamkpa na nsonso a, ma nyekwa nkọwa banyere arụrụala dị icheiche ha rụrụ na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti ahụ, nke gụnyere ebe a kwara ozu n'Ebenebe dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka North', bụ́ ebe a gbagbusiri ndị gara akwamozu; mpaghara 'Unizik Junction', bụ ebe a gbagburu onyeisi òtù jikọtara ndị Keke; Ifite Awka, bụ ebe ndị omekoome na ndị ọrụ nchekwa kwàrà mgbọ; Agụleri, bụ ebe a gbàrà otu nwaanyị ajadụ ọtọ, sèé ya onyoonyoo, ma bokwa ya ebubo na o gburu di ya; tinyere ọtụtụ ebe ndị ọzọ ọ kpọpụtasịrị. O mere ka a mara na ihe dị icheiche e nwetegasịrị n'aka ndị ahụ gụnyèrè ụdị egbe dị icheiche, anyike, ọtụtụ mgbọ egbe, ụgbọala Benz V-Booth (nwere ákàrà efere Lagos HC 661 AAA), ọgwụike dị icheiche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Dịka ọ na-ekele ndị Anambra maka inye ndị uweojii ozi dị mkpa ná-ényére ha aka n'ọrụ ha, ọ rịọkwazịrị ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ. CP Echeng kwèzịrị nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyòcha banyere okwu ha.

NDỊ omeiwu steeti Anambra nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nwee ọgbakọ pụrụ iche ha jiri sị aka chịpụ̀rụ̀ steeti Anambra, bụ Maazị Willie Obianọ ‘Jee nke ọma’, dịka ọchịchị afọ asatọ ya bịagoro na njedobe na steeti ahụ.

  Ọgbakọ ahụ pụrụ iche e mere n’ogige ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyere na ya.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor tòrò Maazị Obianọ maka ọtụtụ ọmarịcha ọrụ mnwògharị dị icheiche ọ rụrụ na steeti ahụ n’ime ahọ asatọ gara aga, ma kọwaa na ha hibere ya bụ ọgbakọ pụrụ iche kelekwa ya maka ezi mmekọrịta dị n’etiti ha bụ ndị omeiwu na isi ọchịchị steeti ahụ.

  Dịka ọ na-akpọpụtasị ezi ọrụ ọkpụtọrọkpụ dị icheiche ọchịchị Obianọ rụrụ na steeti ahụ, Maazị Okafor mere ka a mara na ha na isi ọchịchị steeti ahụ rụkọrọ ọrụ ọnụ nke ọma, iji nye ndị Anambra ezi ọchịchị, ma kelekwa Obianọ maka ibìnyè aka n’ọmarịcha amụma iwu dị icheiche ha mere n’ụlọ omeiwu ahụ.

  Ọtụtụ ndị omeiwu dị icheiche, nke gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Awka South’ nke mbụ n’ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Nnamdi Okafor; ògbò ya nke na-anọchite anya Anaọcha nke abụọ, bụ Maazị Ejike Okechukwu na ọtụtụ ndị ọzọ tìnyèrè ọnụ wee gbaa akaebe banyere ezi ọrụ Willie Obianọ rụrụ na steeti ahụ, nàkwà ezi mmekọrịta dị n’etiti ọchịchị ya na ndị omeiwu steeti ahụ; ma sịkwazie ya gaa nke ọma, dịka ọ na-enyefèzị ọkwa ọchịchị n’aka Ọkammụta Chukwuma Soludo.

  Na nzaghachi, Maazị Willie Obianọ kèlèrè ndị omeiwu ahụ maka ọmarịcha okwu ha dị icheiche banyere ya na ọchịchị ya, ma gwakwa ha buru ekele n’ụkpa bugara ndị ọgbọ nta nkwàdo ha dị icheiche maka ezi nturuugo ahụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA nwetere na nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n’ime ahọ olenaome gara aga.

  O kwèrè ha nkwà na ọ gaghị echezọ ha, ọbụladị ma ugbua ọ rịtugoro n’ọkwa. Ọ rịọkwàzị̀rị̀ ha ka ha gakwa n’ihu nye Gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Soludo ezi nkwàdó zuru oke, iji mekwa nke ọma karịa ya onwe ya, n’ọchịchị ya.

  Ọkammụta Soludo, ndị eze ọdịnala, ndị kọmishọna, ndị ndu otu ndọrọndọrọ APGA, na ọtụtụ ndị ọzọ sònyèkwàra na ya bụ oke ọgbakọ pụrụ iche.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here