Nwata akwụkwọ na Delta: Nnyocha egosila na ọ nwụrụ n’ihi nkụja

0
14

 GIFT Ohanazeze, bụ nne Obinna Udeze, nwata ọnwa iri na iteghete nke ụlọakwụkwọ Arise and Shine Nursery and Primary School, Asaba, steeti Delta, onye nke e wetaburu mkpesa na e ji ụtalị pịagbuo ya, akọwaala na mpụtara nnyocha e mere ozu nwata ahụ (autopsy), iji chọpụta ihe gburu ya gosipụtara na nwata ahụ nwụrụ n’ihi oke egwu/nkụja (septic shock).

  Dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Ohanazeze rụtụrụ aka na n’ihi mpụtara nnyocha ahụ, gọọmenti steeti Delta ga-ewepụ okwu ahụ ụlọikpe.

  O kwuru sị: “Ha kwuru na nkụja kpatara ọnwụ ya. Ihe ahụ e tiri ya mere ka o nwee ọbara mgbali elu, nke bụ otu ihe so akpata nkụja.”

  Ka anyị cheta na anyị wetaburu akụkọ a n’oge gara aga, oge obere nwata ahụ bụ Obinna nwụchara.

  Na Monde, ọnwa Febụwarị dị n’abalị asaa n’afọ a bụ 2022, nne Obinna bụ Gift Ohanezeze kpọgara ya n’ụlọakwụkwọ ka ọ nọ n’ezi ahụike. Nwata otu afọ na ọnwa asaa ahụ bụ izuụka atọ ka o nọrọla n’ụlọakwụkwọ ahụ, ọ ka bụ onye ọhụrụ na ya.

  N’ụbọchị ahụ ka onyenkuzi Obinna, n’Arise and Shine Nursery and Primary School, bụ ụlọakwụkwọ a chọpụtarala na onweghị ikike ọrụ (unregistered home care), nke dị na Camp 74, Asaba, steeti Delta, bụ Emeka Joshua, pịara ya ụtali dị egwu nke nyere ya mmerụ ahụ, nke gachara abalị isii n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC).

  Ka akwụkwọ gbasara ụbọchị ahụ, nne ya bịara kpọrọ ya n’amaghị banyere ntaramahụhụ e nyere nwa ya nwoke site n’aka ndị kwesịrị ilekọta ya anya nke ọma. Ọ bụ ka ọ laruru ụlọ ka ọ hụtara ihe mmeru ahụ ma were ọsọ laghachị n’ụlọakwụkwọ ebe onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ, Oriakụ Ogbo gwara ya na oge agaala maka ụbọchị ahụ, na ọ ga-abịaghachị azụ iji chọpụta ihe merenụ.

  Nwaanyị ahụ ji anya mmiri kọwaa otu e si jiri ụtalị pịagbuo nwa ya, na-ekwusi ike na ha dị ndị nkuzi atọ ji aka ike mesie nwa ya ike, ndị gụnyere onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ, nwa ya nwoke bụ onye okwu kacha n’isi ya, na otu onye nkuzi ọzọ.

  Dịka o siri kwu, ndị klaasị Obinna gbara ama ụdị mmegbu ndị nlekọta ụmụaka ahụ nyere Obinna.

  O kwuru sị: “N’echi ya bụ Tuzdee, akpọrọ m ya gachighaa ụlọakwụkwọ, ọbụ mgbe ahụ ka m hụrụ ya nke ọma, mmerụ ahụ o nwere dị agụta ọnụ. Ka m na-eme mkpọtụ, na-eme ka onye nkuzi ahụ pụta, ụmụaka si na klassị ahụ pụtara gwa m sị ‘big mummy, uncle na aunty ji nkachiifu ọcha (white hanky) kechie Obinna aka na ụkwụ ma na-apịa ya ụtalị ka ewu.’ Oge m jụrụ ha onye bụ ‘big mummy’ ha rụụrụ m onye nwe ụlọakwụkwọ aka. Ajụrụ m ya, ọ gọghị agụgọ, ihe o kwuru bụ na Obinna dị isi ike (stubborn) na ọ bụ ya kpatara ya. Ajuru m onye jidere ya n’aka na ụkwụ, nwa ya nwoke (Emeka) pụtara, lee m anya n’ihu ma kwuo na ọ bụ ya. Nwanne m nwoke nke obere kwuru na ọ ga-apụta iro, ọ maa nwanne m ụra.

  Ọ gara n’ihu kwuo na onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ abịaghị leta nwata ahụ ma na Tuzdee na Wenezdee ma kwuo na ka o ruru ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ Tọzdee, oge ihe mgbu karịrị, e bugara nwata ahụ ụlọọgwụ. Ọ kọwara na oge a kpọrọ ya gaa Live Valley Hospital, dọkịnta gwara ha ka ọ leruchara ya anya na o nwere mmerụ ahụ n’ime, na a pịara ya ịtalị. Dọkịnta malitere nyebe ya ọgwụ, diriipu, ma o nyeghị ya ọgwụ ịba. Ọ kọwakwara na a ka nyere nwata ahụ ọgwụ ịba ọnwa abụọ gara aga n’otu ụlọọgwụ ahụ. Dọkịnta kwuru na ọbụghị ịba, na ọ bụ n’ihi ụtalị ahụ.

  Otu o sila dị, o kwuru na n’ihi na ahụ mgbu ahụ anaghị ebelata, na ha kpọrọ ndịuweojii, bụ ndị rụrụ ọrụ ozugbo. E mechara ziga ha ụlọọgwụ FMC dịka ọnọdụ ya gbanworo nke ọjọọ. Ka anyị ruru ebe ahụ, o koropula, yaabụ ọ baala ‘coma’, ha gbara mbọ ole ha nwere ike ma ọ nwụrụ.

  Dịka akụkọ banyere ọnwụ Obinna gbasasịrị, nwaanyị nwe ụlọakwụkwọ ahụ chọrọ ka ya na ezinaụlọ ya gbaa ọsọ, gbapụ n’obodo ahụ ma a nwụchịkọrọ ha n’ọdụ ụgbọala ebe ọ banyerela ụgbọala na-aga Onitsha dịka ndịuweojii nke Divisional Police Officer nọ n’isi ya gara n’ụlọ ya ma chọpụta na onweghị onye nọ ya.

  Onye bụ isi sekpụ ntị (prime suspect) n’okwu ahụ, Emeka, gbara afọ iri abụọ na anọ bụ nwa nwaanyị nwe ụlọakwụkwọ ahụ na-ekwurịrị na ọ bụghị ụtalị ya pịara nwata ahụ gburu ya dịka ya pịara ya ụtalị obere ole o nwere ike. Oge a jụrụ ya ihe nwa ahụ mere, o kwuru na ọ kwara nwata ọzọ aka, ọkụ isi n’ala.

  Otu o sila dị, kọmishọna uweojii steeti ahụ, Maazị Ari Muhammed Ali kwuru na ha ga-eme ezi nnyocha banyere ọnọdụ a na ka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a, na e kwenyere na ọ bụ ụtalị a pịara nwa ahụ gburu ya, ma na ọ bụzị dọkịnta ịchọpụta site na nnyocha. O kwuru na nke ahụ gachaa, a ga-ewepu okwu n’ụlọikpe.

  Ka anyị cheta na gọọmenti steeti ahụ emechiela ụlọakwụkwọ ahụ bụ Arise and Shine Nursery and Primary School.

  Gọọmenti kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ikike site n’aka ndị ọ dị n’aka ministrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ prịma na steeti ahụ.

  N’okwu ya, kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ, Charles Aniagwu gwara ndịntaakụkọ na ụlọakwụkwọ ahụ bụ ulọ nlekọta ụmụaka edebanyeghị aha (unregistered home care). Tinyere onye otu ya na-ahụ maka agụmakwụkwọ prịma, Chika Ossai, na onye okwupuru onye ọ dịịrị (humanitarian services), Bridget Anyafulu, kọwara na okwu ahụ dị gọọmenti steeti Delta mkpa dịka ha kwuru na ndị mmadụ ma ndị Delta ma ndị si ebe ọzọ na-emetụta ha, ma bụrụ nke na-echu ha ụra.

  O kwuru na ọbụladị nwunye gọvanọ na-achị steeti ahụ, edurula ndị mmadụ ga hụ ụlọ ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ ụlọakwụkwọ ma hụkwa nne nwata ahụ lara mmụọ. Ọ kọwara na gọọmenti ga-eso okwu ahụ ruo na njedebe, n’usoro iwu.

  Otu o sila dị, ndị ọnụ ruru n’okwu akpọọla oku ka gọọmenti lebaa anya ma nnyocha ụlọakwụkwọ nnọọrọonwe niile dị n’ala anyị iji chọpụta ndị ekwesịghị ekwesị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here