Obiano etòóla ọrụ a na-arụ n’Àkwàmmiri Naija 2

0
9
Obianọ (n'aka nri), oge ọ na-ekele Maazị Wiesser Fredrich

AKA chịpụ̀rụ̀ steeti Anambra, bụ Maazị Willie Obianọ etòóla etu ọrụ nṅsi aga n’ike n’ike n’ebe ahụ gọọmenti etiti na-arụ Àkwàmmiri Naịja Nke Abụọ n’Ọnịtsha.

  Maazị Willie Obianọ kwupụtara nke a na nsonso a oge ọ gara njem nleta ịhụ ka ọrụ si aga n’ebe ahụ, bụkwa nke ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ sòrò ya wee gaa.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, o chètàrà na ọ bụ n’abalị mbụ nke ọnwa Septemba ahọ 2018 ka e bidoro ya bụ ọrụ, ma kọwaa na gọọmenti ya wụbàtàrà ma tinye ọnụ n’okwu oge ndị obodo ebe ahụ a na-arụ ọrụ ahụ na ndị kọntraktọ ji ọrụ ngo ahụ nwere nsogbu, ma gbakwa mbọ pụrụ iche iji hụ na e wetere ya bụ nsogbu n’isi njedoba.

  O kèlèrè ọchịchị onyeisi ala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari nàkwà ụlọọrụ ji ọrụ ngo ahụ maka etu ọrụ ahụ si aga n’ike n’ike, ma gakwa n’ihu kpọpụtasịa ọtụtụ uru dị icheiche àkwà mmiri ahụ ga-eweta na mpaghara ahụ, na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, nà mpaghara ala Nigeria n’izugbe ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.

  O kwukwàrà na ọ bụ n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị ka e kwesiri ịgbape ya bụ àkwàmmiri, mana a rụchazịghị ya tupu oge ahụ n’ihi nsogbu so ọrịa nje COVID-19 wee bịa.

  Dịka ọ na-akọwa na a rụchaala otu akụkụ nke ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnitsha, rụchaa ma gbapee ebe nchekwa ihe ọkpụ ‘Ziks Mausoleum’, o kelekwazịrị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari, ma rịọ ya doo ka o jisie ike n’ọrụ ahụ ma rụchapụkwa ya n’oge a kàrà àkà.

  N’okwu nke ya, onyeisi ọrụ n’ụlọọrụ ngo ji ọrụ ahụ, bụ ụlọọrụ Julius Berger, Maazị Wiesser Fredrich, nyèrè nkọwa banyere ihe icheakamgba na ihe mkpọbiụkwọ dị icheiche ha zùtèrè n’ọrụ ahụ, ma kọwazie na ha na-abịazị na njedobe nke ya bụ ọrụ, ọbụladị dịka o kèlèrè aka Maazị Willie Obianọ maka ezi nkwàdo dị icheiche o nyere ha iji hụ na ya bụ ọrụ na-aga aga.

  O mere ka a mara na ogologo ya bụ àkwà mmiri dị otu kilomita na ụma isii, tinyere okporoụzọ di e si aga ya, nke ruru kilomita asaa n’akụkụ Anambra na kilomita at na ụma atọ n’akụkụ Asaba.

  Ọ kọwara na ọrụ okporoụzọ ahụ nọ n’ogoogo pasenti iri asatọ na atọ nke nrụcha ya, ebe àkwà mmiri ahụ nọ n’ogoogo pasenti iri iteghete na atọ nke nrụcha ya ugbua.

  Na ntụnye nke ya n’ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor kọwàrà na a ga-agbape ya bụ àkwàmmiri n’ọnwa Ọktoba ahọ a.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here