Olileanya ndị Anambra ka Obiano na-enyefe ọchịchị n’aka Ọkammụta Soludo

0
10

NDUBISI Nwokedi: Ọchịchị Obiano dị ezigbo mma. Nhafe ọ na-eme n’aka Soludo gosipụtara na steeti Anambra ga-adị mma na-aga n’ihu. Soludo n’onwe ya makwaara ihe ekwe na-akụ dịka Obiano. Ọ bụ ezigbo mmadụ; ọbụladị mgbe ọ nọ n’isi ọbaego ala anyị, o mere nke ọma. Ọ bịara maka ezi ọchịchị, ọbụghị nke mmegbu. Ọ bịara ka o mezie obodo. Ọfọ ọma ka m na-agọrọ ya, nchekwa Chukwu, udo na ọńụ. Otu a Obiano na-ahafe ọchịchị n’aka Soludo ga-agazi. Ajọ ihe agaghị eme ya. Otu a Chukwu họpụtara ya ka ọ chịa, ọ ga-achịrụ anyị n’isi.

Nebechukwu Okafor: Obiano metara ndị ọrụ mma. Anyị na-asịzị ka onye na-abata ọhụrụ mekwa ka o mere. Ọ bụ Obiano hibere  ọdụụgbọelu na steeti Anambra, bụ oke obodo kwesịrị ka o nwee ọdụụgboelu kemgbe. O teela aka a tụbara atụmatụ ịrụ ọdụụgbọelu na steeti Anambra ma onweghị isi. Ka ọ dị ugbu a, ọchịchị Obiano emeela ka steeti Anambra sonye n’ụgbọ ọma.

  Agara m ebe ahụ wee hụ n’ebe niile achawapụla. N’ezie, Obiano gbara mbọ dị egwu. Ya mere, ọ bụrụ na Soludo soro ụkpụrụ ya, ọ ga-adị mma. Ka ọ na-ebunyekwa anyị osikapa Ekeresimesi ọbụla dịka Obiano bụ na ọ rụrụ ọrụ nke ọma, o nwee ihe ọzọ ọ ga-achọ n’ọdịnihu, anyị ga-enye ya nkwado.

Okeke C.E: Obiano etiela ọkpọ saa aka. O mere ihe dike na-eme. O mere anyị bụ ndị ọrụ mma, ana m arịọ Soludo ka o soro ụkpụrụ ya, ma ya welatakwa aka otu o si ewe ndị ya na ha ga-arụ ọrụ. Ọ ga-adịrị ya mma. Olisa bi n’igwe ga na-edu ya, ọdinihu ya ga-aka mma. Udo ga-adịrị ya.

GUO:  Gọvanọ Obiano agbaala afọ iri isii na anọ taa

Okonkwo Kizito: Ana m ekele Chineke maka nhafe ọchịchị n’udo. Ana m ekele Akpokuodike Aguleri, Gọvanọ Willie Obiano, o meela ihe o kwesịrị ime, o mere nke ọma. Onweghị onye ọbụla na-ekpe ekpere ka nwa ọ mụtara ghara ịkarị ya. Ya mere, Ọkammụta Soludo na-abịa ịga n’ihu na-emepe steeti Anambra. APGA bụ ihe kacha mma maka ndị Igbo. Willie Obiano ịhafe ọchịchị n’aka Soludo bụ oke ihe dabara adaba nke ọma, ọdịghị mfe. Ekpere m bụ na Chukwu ga-anọnyere Soludo iji mee ihe a chọrọ na steeti Anambra. Ana m ahụta na ọ ga-agbanwe, ọbụghị sọosọ Anambra, kama ala Igbo niile. A maara ya dịka ọkaibe n’ihe gbasara nhazi akụnaụba n’ụwa niile; n’ezie Anambra bụ obodo a gozịrị agọzị. Ọ ga-ebulite Anambra n’ọkwa dị elu.

Ijeoma Ozumba: Obiano mere nke ọma. Ọ rụrụ ọrụ dị iche iche na steeti Anambra ndị gụnyere ọkụ na-enwugasi n’okporoụzọ (street light) nke chụrụ ndị ohi ọsọ. ọ bụghị nke ị na-aga n’abalị, ụjọ a na-atụ gị. Ọ rụkwaara anyị ọdụụgbọelu, nke mere ka njem ife n’elu ruo anyị aka na be anyị. Ọdụụgbọelu dị ezigbo mkpa n’ụzọ ọbụla. A na m ekwuzi ka Soludo mekarịa Obiano. Ka ọ rụrụ ọrụ na-aga, doziere anyị okporoụzọ, mee ka ọkụ na-adị.

  Ụzọ ọjọọ na-eme ka mmadụ na-atufu oge n’ebe ọ na-eme njem. Ọ bụrụ na enweghị ọkụ, ọ naghị aga aga. O wee bụrụ ya, ana m agọ ọfọ ka Chineke nye ya amamihe ya ka o were chịa. Ka o leta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ka ọ mata na mmadụ niile bụ otu, onweghị onye ka ibe ya. Ka Chineke nye ya obi umeala ọ ga-eji chị.

GUO:  A ga m arụcha ọrụ niile m ji n'aka tupu ọchịchị m agwụ – Obiano

Uche Mba: Obi bụ anyị ańụrị n’ihi ọrụ ọma Gọvanọ Obiano rụrụ na steeti Anambra. Ọrụ ọ rụrụ bụ agụkata agba awaa. N’oge mbụ, egwu ji ndị Anambra n’ihi ọnọdụ enweghị ezi nchekwa. N’oge ahụ, ọ na-akụ elekere anọ nke mgbede, ndị mmadụ agbara gaba n’ụlọụka ebe ha na-arahụ. Ozugbo ọ batara n’ọchịchị ka o wetere ezi nchekwa n’Anambra, ma mee ka ọnọdụ dị mma. Otu ahụ ka ọ dị wee ruo n’oge a, n’agbanyeghịzị ụfọdụ aghara ndị ọjọọ bịaziri na-akpa. Obiano bụ dike, ọ rụrụ ọrụ nke ọma. Ọzọ dị ka ibe ya wee bụrụ na ọ kpara ike n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, site n’ime ka ụkwụ ruo ha ala.

  N’oge mbụ, anaghị akwụ ndị rụrụ ọrụ n’ụlọọrụ a ego a na-akwụ ndị lara ezumike nka n’ọrụ. Ma taa, ọchịchị Obiano emeela ka ha soro ibe ha nwebe ọnụ, maka na e mee nwa ka e mere ibe ya, obi adị ya mma. N’ezie, Obiano wetara udo tọrọ atọ na steeti Anambra.

  Ya mere dịka ọ na-ahafe ọchịchị n’aka onye ga-anọchi anya ya bụ Ọkammụta Soludo, ana m agọrọ ya ọfọ ogologo ndụ na ahụ isi ike. Ọ ga-adịrị ya mma, Chineke ga-enyere ya aka n’ihe ọbụla dị mma ọ ga-achọ n’ọdịnihu. O wee bụrụ ya, n’akụkụ nke Soludo, ọ bụ onye ala anyị. O mere nke ọma nke na mba ụwa niile na-anụ maka ya taa. N’ihi nke a, anyị na-atụ anya na ọ ga-eme nke ọma, maka na ihe a gba n’aka, ejighị enyo ele ya. Steeti Anambra anaghị eti mmụọnwụ a na-akwa aka n’azụ. Soludo ga-ejikwa aka o jiri ti ịgba n’ụlụọbaego ala anyị wee mee ka Anambra bụrụ eji ama atụ.

GUO:  Eduola Onwuamaegbu n'iyi ọrụ dịka ọka ikpe ukwu steeti Anambra

  Ya mere, ana m agọrọ ya ọfọ ka Chineke nọnyere ya, nyere ya aka, ma mee ka ndị ya na ha ga-arụkọ ọrụ bụrụ ndị ga na-eme ihe a tụrụ anya n’aka ha. Ka ha hapụ ịbụ ndị ga-aghasara ya ọrụ. Ana m ekwu na ọ ga-adịrị ya mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here