Soludo, onye amụma dị ire n’ala nna ya

0
13
Dikeudo Isuofia

IGBO kwuru okwu sị na ọ bụ ka onye si eme ka ataṅụ si akpọ ya. O were bụrụ ya, ezi aha na-eso ndụ ọma. Nke a mere na mmiri agaghị amachi nzọ ụkwụ Okammụta Charles Chukwuma Soludo zọrọ n’obodo ya bụ Isuofia, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.

  Charly nwa Mgbafor, dịka a na-akpọ ya bụ anya ndị obodo ya ji ahụ ụzọ. Ọ kpaala ike dị egwu ma zọọ ụkwa dịka dimkpa n’ụzọ dị iche iche. Ọha obodo na-agba akaebe na o nyela ọtụtụ ụmụaka onweghị ndị enyemaka ohere agụmkwụkwọ n’efu; ma na-enyekwa ọtụtụ ụlọakwụkwọ ezi nkwado iji mee ka ha na-agụ akwụkwọ n’enweghị ihe ndọghachi azụ, ọbụla. A kọwakwara na dịka onye hụrụ mmụta n’anya na ọ dịla na mbụ were otu ụlọakwụkwọ prima dịka nke ya kpamkpam, ma na-egboziri ha mkpa site n’inye ha ihe ndị ha ji ekponye mmụta n’ụbụrụ; ndị gụnyere akwụkwọ, akwa njirimara (uniform), tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  N’ihi ezi ọrụ ya, eze ọdịnala Isuofia bụ H.R.H. Igwe Christopher Muoghalu (Isu nke abụọ n’Isuofia) na obodo niile n’ọyọ ji otu obi zukọrịta chie ya echiche ma nye ya aha kwesịrị ya, ‘Dikeudo Isuofia’. Ọ bụ n’afọ gara aga, ka ha na-eme emume iri ji ọhụrụ ka e chiri ya oke echichi ahụ nke ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu bịara soro gbaa aka ebe. Gọvanọ Willie Obiano (Akpokuedike) na nwunye ya, Ndi Onowu sitere n’okpuru ọchịchị dị otu narị, iri asaa na iteghete mejuputara steeti Anambra tinyere ndị nọgasị n’ogogo dị iche iche bịara n’ozuzu oke.

GUO:  Soludo akpọlitela mmadụ isii n'ọkwa

 Igwe Muoghalu ji ọṅụ gosipụta afọ ojuju obodo Isuofia nwere n’ebe nwa ha, Soludo nọ. O kwuru na ha na-akwanyere ya ugwu n’ihi mbọ ya n’ịhụ na e nwere udo na ịdịnotu n’Isuofia.

 Ya mere, ka Igwe Muoghalu chichara ya echichi site n’ikpunye ya okpu mmeemmee na ihe ndị ọzọ so ya, o ji ọṅụ kwuo sị, “Kịtaa, Isuofia abụrụla ofu.”

  Ka nke ahụ gachara, Ọkammụta Soludo kelere ndị nke ya maka ugwu ha kwanyeere ya. O kwere ha nkwa ịnọnyere ha oge niile site n’ịdị na-eme ihe o kwesịrị ime oge niile. O kwere ha nkwa ezi enyemaka.

  N’aka nke ọzọ, ndị eze ọdịnala niile nọ n’Aguata na Orumba adịkwala na mbụ, n’afọ 2004 mgbe e nyechara ya ọrụ dịka Gọvanọ ọbaego ala anyị, Central Bank of Nigeria (CBN); chie ya echichi iji gosị na ọ bụ nwa Aguata maara ihe ekwe na-akụ. E nyere ya aha dara ụda, “Odenigbo Aguata na Orumba”.  Aha ya na-ada ụda n’ochie Aguata (old Aguata) niile, n’ihi ọ na-ezo ka mmiri na gburugbu ya.

 E wepụkwarị n’obodo ya, mba dị iche iche dịka Aguleri echiela ya echichi maka na anya ụwa niile na-ahụ ihe dị mma, ma na-eṅomikwa ya. Eze Dọkịnta Micheal C. Idigo (V) Ezeudo Aguleri chiri ya Odenjinji Aguleri n’afọ 2020.

  N’ihi na Ọkammụta Soludo na-ede n’Oru na-ede n’Igbo, mba dị iche iche karịrị otu narị n’ọnụọgụ n’ala Nigeria gbaa gburugburu, echiela ya echichi.

 Ya mere, dịka e kwuru na ndị mmadụ anaghị anabata ndị amụma ha nwere, Ọkammụta Soludo, site n’ezi ọrụ emeela ka ụwa mata na onye amụma na-adị ire n’ala nna ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here