ỤLỌỌRỤ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) anwụchikọọla ndị ọrụ Computer Based Test (CBT) adigboroja, nke ndị ga-ele ule 2022 Unified Tertiary Matriculation (UTME).
N’ozi ahụ nke sitere n’aka JAMB mere ka a mata na ha mere ezi nnyocha na steeti anọ – Kwara, Kogi, Kastina na Enugu.
JAMB gbara ama na ndị ahụ anwụchikọrọ bagidere ndebanye aha ahụ n’ihi ego ha ga-enweta na ya site n’itinye akọrọngwa n’enweghị ikike.
A kọwara na a hafeela ụfọdụ ndị ọrụ sitere n’ụlọọrụ atọ n’ime anọ ndị ahụ a nwụchikọrọ n’aka ndị ọrụnchekwa maka nnyocha na ikpe ha ikpe.
JAMB adịla na mbụ kwuo na ha agaghị anabata ọnọdụ adabaghị dịka o kwesịrị site n’aka ndị ọrụ.
Registra, Ishaq Oloyede ka ọ na-elele ka ndebanye aha si aga na mahadum Ibadan, University of Ibadan Distance Learning Centre, chetaara ndị isi ogige CTB mkpa ọ dị ịgbaso iwu wee rụọ ọrụ ha, ka ha ghara ibụ ihe ọgbata uhie nye ndị ahụ ga-elele ule.
Oloyede onye gara letakwara CTB ndị ọzọ na mpaghara ahụ, ya na ndị ntaakụkọ; wepụtara ohere ya na ndị ga-ele ule ahụ wee kpakọrịta otu ha siri hụta ndebanye aha nke ha na-eme.
Ka ọ dị ugbu a, JAMB kwuru na mmadụị edebanyela aha maka ule UTME na direct entry.
Otu o sila dị, JAMB adọọla ndị new ụlọakwụkwọ (proprietors) aka na ntị ka han ghara idebanya imirikiti aha, ma bokwa na ha na-anapụ ndị mmadụ ego karịa ka o kwesịrị mala ndebanye aha UTME. Ha gwara ha ka ha wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ n’ihi na JAMB ga-akụrụ ndị e nwetara na-akpa ụdị arụ ahụ egwu nke agaghị ịgba.