A tụọla onyenche ụlọoriri nga maka izu ohi anụ na mmanya

0
11

ỤLỌIKPE Dei-Dei Grade I Area Court nke dị n’Abuja atụọla otu onyenche (security guard), Okoh Richard nga ọnwa atọ maka izu anụ na mmanya n’usekwu (kitchen) ebe ọ na-echekwa.

  A kpụpụrụ Richard onye ọrụ n’ụlọoriri na ọńụńụ Edimony Hotel, Abuja ụlọikpe maka izu ohi.

  Ọkaikpe, Sulyman Ola, otu o sila dị nyere Richard ohere iha nha (option of fine), puku naịra iri abụọ (N20,000). Ola kọwara na ntaramahụhụ gaara aka njọ ma ọ bụrụ na onye ahụ dara iwu egbochighị ụlọikpe ahụ ime nnyocha tara akpụ. Ọ dọkwara ya aka na ntị ka ọ na-akpa agwa dị mma.Richard dị na mbụ kweta na ya kpara arụ ahụ, ma rịọ ka ụlọikpe ahụ mere ya ebere.

  Na mbụ, ọkaiwu (prosecution counsel) Maazị Olanikpekum Babajide gwara ụlọikpe na onye wetara mkpesa, Maazị Echizona Mogboma nke Halogen Security Ltd wetere ya n’ogige ndị uweojii, Dawaki Police Station, Abuja.

  Babjide kwuru na etinyere onye ahụ a mara ikpe n’ọrụ n’ụlọoriri na ọńụńụ Edimony Hotels and Resort Katampe maka iche nche na ilekọta ogige ụlọoriri na ọńụńụ ahụ.

   Ọ kọwara na ka ọnwa Maachị dị n’abalị asatọ, n’ihe dịka elekere asaa nke uhuruchi, na onyenche ahụ, nke a mara ikpe kụkasịrị ma bunye n’usekwu ‘flat I kitchen’ dịka onye omekome, site na windo ma zuru anụ na mmanya. Ọ gara n’ihu kwuo na ya bụ nwoke gbara mbọ ịkụwa ma n’ime ime nke onye nlekọta (manager) Edimony Hotel, mana aka kpaara ya.

  N’oge nnyocha, o kwuru na onye ahụ a mara ikpe kwuputara na ya kpara arụ ahụ n’ezie.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here