Na Kaduna, CAN akpọọla oku ka ndị ụka kee nkwụcha

0
9
Hayab

CHRISTIAN Association of Nigeria (CAN), ngalaba steeti Kaduna akpọkuola ndị steeti ahụ ka ha zọọ ndụ ha n’ihi ọnọdụ ha kọwara ka nke dapụtara maka nleghara anya gọọmenti n’ịzọpụta ndị nke ha n’aka ndị na-awakpo ha.

 Ha kpọrọ oku ahụ n’ihi mwakpo a wakporo Akpan Kagoro nke dị n’okpuru ọchịchị Kaura na steeti ahụ, ebe ndị omekome gburu imirikiti ndị mmadụ, tinyere ndị e merụrụ ahụ, ma gbakwaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.

 Otu onye nọ n’obodo ahụ mgbe ya bụ ebelebe gburu kwuru sị: “E gburu ọtụtụ ndị mmadụ ebe ahụ, a na-echekwa na e gburu ụfọdụ n’ime ụlọ ha, ebe ndị ọzọ nwere ike ịnwụ n’ụgbọala bọọsụ n’ihi mmerụ ahụ ha nwetere maka mgbọ egbe tụrụ ha.”

  Ọ gara n’ihu kọwaa na ya enweghị ike inyenwu ọnụọgụ ndị e merụrụ ahụ na ụlọ ndị a gbara ọkụ n’ihi na ihe ha mebiri karịrị akarị ma dịkwa oke njọ.

 O kwuru na ndị ahụ mere mwakpo ahụ, bụ ndị e chere na ha bụ ndị Fulani bịara n’igwe ma hazikwaa onwe ha nke ọma dịka o kwuru sị: “Ha buru ngwa agha dị egwu bịa wee kpaa mkpamkpa ndị gụnyere imebi ndụ mmadụ, ụlọ, tinyere akụnaụba ndị obodo.”

  Otu o sila dị, aka na-achị steeti ahụ, Gọvanọ El-Rufai n’ozi ya site n’aka Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa nke ime na ihe metụtara obibi ụlọ ( Internal Security and Home Affairs), Samuel Aruwan kọwara na ọnọdụ iwu onye apụtala iro (24-hour curfew) e tiri na steeti ahụ bụ iji me ka ndị ọrụ nchekwa nwee ike hazie ọnọdụ n’ogbe ndị ahụ o metụtara.

GUO:  CAN akpọkuola gọọmenti Kaduna ka ọ kwụsị ọbara a na-akwafu ebe ahụ

  N’ihi ndụmọdụ ndị ọrụ nchekwa, gọọmenti steeti Kaduna tiri iwu ahụ n’okpuru ọchịchị Jema’a na Kaura ozigbo; iji nyere ndị ọrụ nchekwa aka ịhazi ọnọdụ n’ebe ndị ahụ, zọpụta ndụ na akụnaụba ma wechighakwaa iwu obodo n’ozuzu oke.

 Ya mere, gọọmenti na-arịọ ndị okpuru ọchịchị ndị ahụ ka ha sọpụrụ ndị ọrụ nchekwa iji hụ na e weghachiri udo n’ebe ndị ahụ. Gọọmenti katọrọkwara mwakpo ahụ.

 N’aka nke ọzọ, n’ozi nke Onyeisioche steeti ahụ, Rev. John Joseph Hayab binyere aka na ya, CAN kwara arịrị na steeti Kaduna atụfuola ọtụtụ ndụ n’ime afọ anọ gara aga, ebe ndị ọchịchị anaghị egosịkebe mmetụta  maka ndị ihe mere, ma kwuo na nzaghachi ha na-abụkarị n’usoro nzikọrịka ozi.

 Ozi ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ kwuru sị: ” Otu Christian Association of Nigeria (CAN), ngalaba steeti Kaduna nọ na mwute ma na-eru ụjụ banyere ogbugbu, ntọrị, mwakpo ndị omekome na ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ na-asọ ntị oyi, na-aga n’ihu na steeti anyị nke onweghị oke mbọ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa na-agba banyere ya. Mmadụ kwesịrị ịhụ otu ndị omekome wakporo Kagoro si egbu ma na ahụ ndị mmadụ n’ọkụ, iji kpebie na ndụ a nke a tụfuru dị oke egwu. Olee mgbe ihe ọjọọ a ga-agagide n’ihu, oleekwanụ mgbe ndị ndu anyị ga-eme ihe ha kwesịrị ime?.”

 Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na ike agwụla ndị niile bi na steeti ahụ banyere gọọmenti ime ihe o kwesịrị ime, ma kwuo na ha chọrọ ịnụ ma jiri anya ha hụ na a nwụchikọọla ndị ogbu ọchụ na ndị ntọrị ahụ. Ọ gakwara n’ihu kpọkuo ndị bi na steeti ahụ ka ha kee aji n’ume ma zọọ ndụ ha na obodo ha, ma mee ka ha mata na nke ahụ bụ ihe ha kwesịrị ime ma gọọmenti jụ ichekwa gị.

GUO:  CAN akatọọla ọchụchụ a chụrụ ụmụnwaanyị abụọ juru iyi tụrọụza NYSC

 N’aka nke ọzọ, ndị ọjọọ ahụ gbukwara imirikiti ndị mmadụ na steeti Zamfara.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here