N’Awka, nnukwu ụgbọala abụọ adaala, gbaa ọkụ ebe ụzọ gbara anọ

0
10

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị na-anya ụgbọala ka ha na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma ma na-ebèlata etu ha si agba ọsọ, n’ihi na ịgba oke ọsọ sò n’ihe kacha ewèta ihe mberede okporoụzọ.

  Onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ n’ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kpọrọ oku a n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere ajọ ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara nsonso a na mpaghara Agụ Awka dị n’isi obodo steeti ahụ, bụkwa nke ụgbọala gwongworo abụọ sitere na ya wee gbaa ọkụ.

  Ọ kọwara na ịgba oke ọsọ na elerughị ụgbọala anya nke ọma tupu e buru ya pụta n’okporoụzọ sò n’ihe na-ewètekarị ụdịrị ihe ọdachi dị etu ahụ. O mere ka a mara na ụgbọala na-adàkarị na mpaghara njikọ ụzọ Agụ Awka ahụ, bụ nke dị n’okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnisha, ma kwuo na ọtụtụ ụgbọala ndị ahụ bụ ụgbọala e lerughị anya nke ọma maọbụ nke e kwesighị ibu pụta n’okporoụzọ.

  Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na ụzọ ahụ adịchaghị mma etu o siri kwesi, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere o jiri dị mkpa na onye ọbụla na-anyà ụgbọala ga-eji nwayọ ka o wee hụ ka ọnọdụ okporoụzọ dị n’ihu. O kwuru na ihe mere ọtụtụ ụgbọala, ọkachasị ndị nnukwu ụgbọala, ji adàkarị n’ebe ahụ bụ n’ihi etu ndị na-anyà ụgbọala ahụ si anya ya, etu ha si agba oke ọsọ, nakwa etu ha esighị elekọta maọbụ eleru ụgbọala ha anya nke ọma.

  Ọ gbarụrụ ihu na n’agbànyèghị mbọ niile ụlọọrụ ya na-agba ịkụziri ndị na-anyà ụgbọala ihe ha kwesiri ịma banyere ịnya ụgbọala na etu e si elekọta ụgbọala anya nke ọma tupu buru ya pụta n’okporoụzọ, na ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala ka na-eme etu o siri masị ha

  Ọ katọ̀kwàra etu ọtụtụ ndị na-anyà ụgbọala si etinye naanị otu akara efere n’ihu ụgbọala ha, n’etinyeghị nke ọbụla n’azụ, ma kwuo na nke ahụ na-eme ka a na-ahụta ụgbọala dị etu ahụ dịka ụgbọala e ji arụ arụrụala, tinyekwuoro na o megidere iwu na-achị okporoụzọ.

  Ọ dụkwazịrị ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepu aka na ya ma tinye akwụkwọ maka inwete akara efere ọzọ ma ọ bụrụ na nke ochie ha furu efu, maọbụkwanụ ha adị njikere ịgba egwu a ga-akụrụ ha.

  Maazị Irelewuyi gwakwàzịrị ndị na-anya ụgbọala ka ha zeere ihe ọbụla ga-ebute ọdịda ụgbọala, ụgbọala ịgba ọkụ maọbụ ụdị ihe mberede okporoụzọ ndị ọzọ na steeti ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here