N’Awka, ochie fada, Anisiobi akpọkọba ndị agadi ibe ya, nye ha ndụmọdụ

0
12

IGBO kwuru okwu si na e zuo ka a ha eri udele, a totuo ngịga. O were bụrụ ụka ma bụrụkwa okwu. N’izuụka gara aga ka otu okenye ụkọchukwu nke Achịdayọsis Onitsha, gbara afọ iri iteghete na anọ, Fada Hillary Anisiobi kpọtụụrụ ndị okenye fada bi na Priest’s Welfare Home nke Katọlik dayọsis Awka.

  Okenye fada ahụ, bụkwa onye ọrụ ahụike n’nọọsụ’ nyere ndị otu ya ndụmọdụ ka ha zeere ụfọdụ ihe oriri ha dị mbụ eri mgbe ha emebeghị agadi dịka ọ rụtụrụ aka na ụfọdụ ihe oriri ndị ahụ ga-echere ahụike ha aka mgba ugbu a.

  Fada Anisiobi kwuru sị: “Ọ bụ otu m si agba mbọ eleru onwe m anya, tinyere amara Chineke mere m ji bie ndụ ruo afọ iri iteghete na anọ n’ụwa.”

  Msgr Basil Kenechukwu Nwazojie, oge ọ na-anabata fada ahụ gosiputara ọńụ ịhu ya anya ọ bụladị n’agadi ya. Msgr Nwazojie onye ya na Fada Anisiobi nọrọ na klaasị oge ha na-agụ akwụkwọ kelere ya maka ndụmọdụ o nyere ha, dịka o kwuru sị: “Obi dị anyị ụtọ ịhụ gị ọzọ. Anyị na-enwekwa ọńụ na ị nọ n’ezi ahụike. Obi dị m ụtọ n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na mụ na gị nọrọ n’otu klaasị na seminarị, ị ka gbasiri ike ma na-emesịkwa ihe ike.

  N’akụkụ nke ya, ụkọchukwu na-ahụ maka ogige ahụ, Fada Emmanuel Udu kọwara na ọnaghị adị mfe ilekọta ndị fada ahụ merela agadị. O kwuru na ihe kacha chere ya aka mgba n’ebe ahụ bụ ịhazị onwe ya iji nwee ike ghọta ndị agadi fada ahụ.

  O kwuru sị: “Ọ bụ nnukwu ihe iche aka mgba, ma isi ọńụ m bụ na enwere m nkwado nke Most Rev. Bishop Paulinus Ezeokafor bụ bishọp dayọsis Awka na ụmụnne m ndị fada.” Ọ gara n’ihu kọwaa na mgbe ọbụla ọ kpọrọ fada ma ọ bụ bishop oku maka mkpa ọbụla, ọ na-abịa na mmezu ozigbo.

  N’ikpeazụ, ndị fada ahụ kpekọtara ekpere ọnụ ma kwugasịkwaa ihe dị iche iche ha gabigarala n’ụwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here