OTU izuụka taa ka Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo, bụ onye jibu ọkwa dịka gọvanọ ụlọọbaego ala anyị, Central Bank of Nigeria (CBN) rigooro n’ọkwa ịchị steeti Anambra. Ya mere taa, ọ bụzị Gọvanọ Anambra; ọ nọchiri anya Chiifu Willie Obiano, onye chịrị Anambra afọ asatọ.
Anambra so na steeti kacha nwe chi ọma n’ihe gbasara ndị ọchịchị. Anaghị ama aka, nke o ji abụ ime ọnụ, ihe dị ka kemgbe afọ iri abụọ ma ọ bụ iri na iteghete gara aga, ka Anambra na-egbuke n’ihi ụdị ndị ọchịchị ha na-enwe dịka Sinetọ Chris Ngige, Chiifu Peter Obi wee ruo na Chiifu Willie Obiano.
Ọ bụladi tupu eduo Ọkammụta Soludo n’iyi ọrụ na Tọzdee gara aga, ndị ala anyị niile, ọ bụghị sọọsọ ndị steeti Anambra maara na ọ ga-eme nke ọma. Ihe agba n’aka eji enyo ele ya? Azịza ya bụ mba! Aha Ọkammụta Soludo na-ada ụda n’ala anyị niile gbaa gburugburu. Ọ kapaala ike dị egwu na ngalaba dị iche iche. Ọ bụ onye ụwa ga-ańụrụ iyi na ọ naghị akwado ihe ọjọọ n’ihi na ọ na-akwụba aka ya ọtọ n’ihe niile ọ na-eme. Ọ bụ ya mere na ndị Anambra nuputara n’igwe tụụrọ ya akwụkwọ, sị ya bịa bụrụ onye ndụ ha.
Site n’okwu ọnụ ya na omume ya, ọ gbara n’anwụ na njem ya ịbụ gọvanọ Anambra bụ ka o jeere obodo ya ozi nke ga-eweta mmepe na ọganihu. O kwuru tupu e duo ya n’iyi ọrụ na ya achọghị ka e mee ya ka ọ daa ụda nke ukwuu n’ihi na ọ chọrọ ịba kọba n’ubi onye ọ bịara, n’ike n’ike n’eleghị anya n’azụ. Otu ahụ o kwuru ya ka ọ dị, n’ihi na ọ malitere ọrụ ozigbo e duchara ya n’iyi ọrụ.
Ka ọ dị ugbu a, ọ kọwapụtala njikere ọ dị inye ndị na-emepụta ihe n’ala anyị nkwado, dịka ndị na-emepụta akwaete, akpụkpụụkwụ na mmanya nkwụ. Ihe ndị a ga-eme ka akaọrụ ndị ahụ chawapu ma na-amịta mmịmị dịka o kwesịrị.
Ya mere, ọńụ na-egbu ndị Anambra ka mmanya ugbu a n’ihi nzọụkwụ ọma gọvanọ ọhụrụ, Ọkammụta Soludo zọpụrụ dịka dimkpa anya ruru ala, maara ihe ekwe na-akụ. Ha na-aja ya ike ma na-agọrọ ya ọfọ ọma dị iche iche. Otu o sila dị, ha gakwara n’ihu dụọ ya ọdụ ka ọ mara ka o si anabata ndị mmadụ ga-eso ya rụọ ọrụ maka ọdị mma Anambra. Ka o jiri uche ya tulee ndị ọma na ndị ọjọọ n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ndị ọchịchị nso ka ha were ghasaara ya ọrụ.
Ha na-akpọku ya ka o hie asaa n’anya, ka aka enwe ghara ịbata n’ofe ncha ncha maka na ọ bata, ọ bụrụ na amaghị ihe e mere ya, ọ ghọọ aka mmadụ; mgbe ahụ ọ bụrụ nsogbu. Ya mere, ka Soludo họrọ sọọsọ ndị mmadụ maara anya e lere ele na nke a rọrọ arọ ka ha soro ya rụọ ọrụ.
Ha gwakwara n’ihu rịọ ya ka o lebaa anya n’ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na steeti Anambra, nke na-achọ ịghọzi omenala. Ka ọ mara ụzọ ọ ga-esi lebanye anya na ya ka udo tọrọ atọ batakwa n’Anambra, n’ihi na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-aghasa obodo.
Ha rịọkwara ya ka o lerukwaa anya n’ajọ ọnọdụ okporoụzọ nke chere steeti Anambra aka mgba. Ọ bụ eziokwu na ọ gaghị arụcha ọrụ ndị a niile n’otu oge, kama otu o sila dị, ka o leruo anya na okporoụzọ ndị a ruburu arụ, bụ ndị na-emebizi emebi.
O were bụrụ ya, ndị Anambra ji otu obi wee nabata Ọkammụta Soludo dịka gọvanọ ọhụrụ, ma kpọkuo onye ọbụla ka ha nye ya nkwado.