N’Obosi, ụmụokorobịa awakpòla, kwatuo ụlọụka maka nsogbu ókè ala

0
9
Fada Olundienigwe

NDỊ ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee wakpò ma bibie otu ụlọụka a maara dịka ‘Olu Ndi Enigwe Adoration Ministry’ dị n’Obosi, n’okpuruọchịchị ‘Idemili North’ nke steeti Anambra, n’ihi nsogbu ịzọ oke ala na-adapụta n’etiti ndị obodo ahụ na ndị nwe ụlọ ụka ahụ, bụ nke binwuuru ọkụ na nsonso a.

  Ya bụ nsogbu oke ahụ bụ nke malitere kemgbe, ma bụrụkwa nke ka na-agawanye n’ihu ugbua n’agbànyèghị ntụnye dị icheiche na oku ikpe udo niile ndị e ji okwu ha agba izu kpọgoro n’etiti ndị ụka ahụ na ndị obodo ahụ, ma nke e mere site n’aka Ashbishọọpụ Valerian Okeke nke ụka Katọliki na Dayọsis Ọnitsha, na ụfọdụ ndị ọzọ.

  N’agbànyèghị mgbataọsọ niile ahụ, akụkọ kọzịrị na ndị ntorobịa Obosi jiri iwe, buru katapịla, wee ga kwatuo ụlọụka ahụ, tikpọ̀sịa ihe dị icheiche e ji aka ụka n’ebe ahụ, ma tikwa ụfọdụ ndị ụka ahụ nọ ebe ahụ ihe tupu chụpụ ha n’ala ahụ.

  N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere nke ahụ, onye mgbazi nke ime mmụọ n’ụlọụka ahụ, bụ Rev. Fr. Jude Uche Olundienigwe kọwara na ala ebe ahụ ha rụrụ ụlọụka ahụ bụ nke dịbụ plọọtụ iri abụọ na atọ ha gotere site n’aka ndị ezinụlọ Ụmụopi.

  Kaosiladị, ọ kọwara na gọọmenti etiti wèèrè plọọtụ iri n’ime ala ahụ wee rụọ ọrụ oge a na-achọ ịwa ụzọ maka Àkwàmmiri Naija nke abụọ, ma nye ha ego iti aka n’obi; o wee fọzie plọọtụ iri na atọ.

  O kwuru na ọ bụzị plọọtụ iri na atọ ahụ fọrọ afọ ka ndị ntorobịa obodo ahụ bịazịrị na-etinye aka na ya ma na-achọ ịkpara ugbua.

GUO:  Ụlọ elu okpukpu anọ adaala n'Obosi

  Ọ gazịrị n’ihu kọwaa etu ndị ahụ siri buru katapịla  wee wụbàta ebe ahụ, wee jide ihe niile dị ebe ahụ niile; ma mekwa ka a mara na mbọ niile ọ gbara ịkpọ na ịnụta ọnụmmiri okwu eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Chidubem Iweka, ka ọ mara na ọ bụ ya dunyere ndị ntorobịa ahụ ọrụ ọjọọ ahụ ha bịara (dịka ha siri kwuo), a mịtàghị mkpụrụ ọbụla, n’ihi na Igwe ahụ azaghị ekwentị ya maọbụ kpọghàchi azụ.

  Ha kwukwàrà na ha kpọrọ onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ikechukwu Okolo, banyere ya bụ ohe, mana ọ gwara ha na ọ gaghị eme ihe ọbụla, ruo mgbe ọ nụrụ olu Igwe banyere nke ahụ.

  Na nzaghachi ya banyere ebubo ahụ, Igwe Iweka kwuru na o nweghị mgbe o jiri dunye ndị ntorobịa ka ha ga kụtuo ụlọụka maọbụ bibie ihe ọbụla n’ebe ahụ.

  Na ntụnye nke ya, Maazị Okolo, bụ onyeisi ọchịchị obodo ahụ, kwùrù na ọ bụ ụkọchukwu ahụ ji aka ya butere onwe ya nsogbu ahụ dakwàsịrị ya, ma kọwaa na mbọ niile ya onwe ya gbara dịka onyeisi obodo ahụ iji kpee udo n’etiti ndị ụka ahụ na ndị ntorobịa ahụ bụ nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla n’ihi ekweghịekwe ụkọchukwu ahụ.

  O kwuru na ụkọchukwu ahụ nọgidere kwụsịzie ịza oku a na-akpọ ya n’obi eze ọdịnala obodo ahụ banyere okwu ala ahụ, n’ihi na ọ sị na o nweghịzị ntụkwasịobi n’ebe ọchịchị obodo ahụ nọ.

  O bòkwàrà ebubo na ụkọchukwu ahụ jìrì ụlọụka ahụ wee rụchie ụzọ ebe ndị ọzọ nwere ala na mpaghara ahụ si abanye n’ala ha, nke mezịrị ndị ntorobịa ahụ jiri gaa n’ebe ahụ iji kwatuo ya bụ ụlọ, kpochaa ma weghàchitekwa ụzọ ahụ a rụchiri arụchi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here