Uzu na-akpọtụ maka nwada Chidinma tuuru ugo wee bụrụ ezenwaanyị ụlọnga Kirikiri, Lagos

0
11

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ka ndị ọchịchị ụlọnga, Correctional Centre, Kirikiri, Lagos haziri ihe emereme onye kacha ibe ya mma (beauty contest); maka ndị a tụrụ nga na ndị a ka na-ekpe ikpe bi n’ụlọnga ahụ.

  Emume ahụ nke osote onyeisi ụlọnga ahụ, Lizzie Ekpendu chịkọbara bụ nnọọ nke nyere ma ndị ọrụ ma ndị ọbịa oke ọṅụ.

 Ekpendu kọwara na ebumnuche o ji hazie emume ahụ bụ iji mee ka obi sie ndị ahụ bi n’ụlọnga ike, ka ha mata na ha ka sokwa n’ihe a na-eme, na olile anya ka dị n’ebe ha nọ. Ọ kọwara na dịka ọ rụrụla ọrụ ọtụtụ afọ na ngalaba dị iche iche n’ala anyị, na emume igosipụta mma ahụ bụ otu n’ime atụmatụ ya dị iche iche iji weta mgbanwe na ndụ ndị ahụ nọ n’ụlọnga, ya na iji mee ka obi ghara ikoropụ ha. Ọ gara n’ihu kọwaa na asọmpi ahụ ga-eme ka ha gosipụta ụdịdị ha ma kurutụ ume ndụ, dịka ọ rụtụkwara aka na ọ bụ otu ụzọ a ga-esi wugharịa ma ndị a marala ikpe ma ndị a ka na-ekpe ikpe.

 Ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu gụnyere ndị ụka, otu nnọọrọ onwe, tinyere otu ndị ọzọ ga, gbara zuzugbe ebe ahụ iji nye ndị ahụ sọrọ mpi onye kacha mma, okwu agbamume na okwu nke mmụọ.

 Ekpendu gbara ama na ndị ọrụ ụlọnga na-agba mbọ dị egwu nke ndị mmadụ anaghị achọpụta.

 O kwuru sị: “Ana m ewetu onwe m ala dịka Jesu Kristi siri me, ma na-enye Chukwu ohere ka o mee ihe ndị ọzọ. Ndị mmadụ nwere ike ha agaghị aghọta ihe m mere ebe a taa, ma ọ na-adị mma mmadụ iwetu onwe ya ala. Ana m agba mbọ iwebata atụmatụ ọhụrụ oge niile, iji weta mgbanwe, weta aṅụrị n’ebe ụmụ  nwaanyị nọ nga nọ. Ka anyị ghara ichezọ na aṅụrị na ọchị bụ ọgwụ. Ụwa taa juputara na mkpọtụ. Nke a ebutela ọtụtụ enweghị ndidi na ọgbaghara. Ka anyị hapụ ikpe ikpe kama ka anyị wepụta ohere gee ntị, ka anyị wee nwee ike nụ nke bụ eziokwu tupu anyị amaba ikpe.”

 Ekpendụ kwuru na ya chịkọbara emume ahụ ka ya wee mee ndị ahụ bi n’ụlọnga, obi ụtọ, n’otito nke Jesu Kristi.

Otu o sila dị, ọ kpọkuru ụwa ka ha hụta ndị ahụ sọrọ mpi dịka ndị ga-abụ ezigbo nwunye n’agbanyeghị na ha nọ na nga, ma bụrụkwa ndị enwere ike ịgbanwo agwa ha iji bụrụ ọkacha mma.

  N’okwu ya banyere ndị ụlọọrụ ha sọrọ mpi, Ekpendu rụtụrụ aka na ọchịchọ obi ya bụ igosị ụwa ndị mara mma ma nwekwaa ọgụgụ isi, bụ ndị na-elekọta ndịnga n’ebe ahụ, ndị ji ịhụnanya na-eduzi ha n’ụzọ mgbanwe.

 Onye nnọchite anya Onyeisi, (Comptroller General) ebe ahụ, Uche Nwobi kọwara emume ahụ dịka ụzọ e si agbaziri ụmụnwaanyị ahụ iji bụrụ ezigbo mmadụ.

  Ọ gwara ha sị: “Gaanụ n’ihụ na-amụta, ndụ na-aga n’ihu na-akụzi; elegharana ịhụnanya onye hụrụ gị n’anya ma na ahụ maka ọdị mma gị. Ekpena mmadụ ikpe maka okwuọnụ ndị ọzọ. Onweghị onye nọ n’ụwaa dị ọcha ma zukwaa oke. Otu ụbọchị, ndị mejọrọ gị ga-akwa arịrị ihe ha jiri me otu ahụ.”

 N’usoro otu e siri hazi emume ahụ, ndị ọrụ ụlọnga ahụ dị iri na otu n’ọnụọgụ soro sọ mpi onye ga-abụ ‘Mrs Correctional Facility’. N’ikpeazụ, Oriakụ Torty Helen tuuru ugo, ebe Oriakụ Ene Oduh na Oriakụ Azuh Esther sotere ya.

  Nke bụzi egwu e ji bụ mpụta nke ezenwaanyị ụlọnga (prison queen), Nwaada Chidinma Ojukwu, nwaakwụkwo agba nke atọ, na-agụ ihe ọmụmụ Mass Communication na mahadum, University of Lagos, bụ onye a na-ekpe ikpe na o gburu otu onye a maara nke ọma n’ihe gbasara onyoonyoo (super TV chief executive officer), Usifo Ataga.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here