Agụmagụ ọdịnala ndị Igbo (2)

0
13

N’IZUỤKA gara aga, anyị kwuputara agụmagụ ọdịnala dị iche iche, ma nye ọmụmaatụ ilu. Taa anyị ga-eleba anya n’agwụgwa na okwumgbawaọnụ/okwuntabiire.

Agwụgwa:- Agwụgwa bụ otu n’ime agụmagụ ọdịnala e nwere n’ala Igbo. Ọ na-adị n’ụdị ajụjụ ma bụrụkwa nke a na-echemi echiche ime tupu e nweta azịza ya. A na-akpọkwa ya ‘gwam gwam gwam’ n’ihi na ọ bụ otu e si amalite ya dịka anyị maara na ọ na-abịa n’ụdị ajụjụ. Ọmụmaatụ agwụgwa: Gwam gwam gwam ihe kụrụ aka baa ọhịa — Azịza ya bụ ụkpaka.

Gwam gwam gwam ihe ji ikpere gazuo ubi nna gị –Azịza ya bụ ọgụ

Gwam ihe ku mmiri rigoo elu — Azịza ya bụ Akụoyibo

Gwam ihe na-achị gị waka n’ubi nna gị — Akwụkwọ akpụ.

Gwam akwụkwọ ugiri ada n’ukwu ugiri — Nwanne anaghị alụ nwanne

Gwam ihe ọgaranya jiri rachaa ntụ — Ube

Gwam ude a sụrụ na mba a nụ ya na mba – Egbe

Gwam mmadụ abụọ na-aga n’ụzọ, mmiri na-ama otu onye ma ọ naghị ama onye nke ọzọ — Nwaanyị dị ime.

Gwam ihe gbara aka baa ubi chịrị ụmụ pụta – Ede

Okwumgbawaọnụ/Okwuntabiire:- Nke a bụ okwu ndị yiri onwe ha ma ha enweghị otu ụdị ụda. Dịka aha ha diri dị, a na-ekwu ha ọsọ ọsọ. A tụrụ anya na onye na-ekwuputa ha ga-enwe ike kpọpụta ahịrịokwu ahụ ọtụtụ ugboro n’enweghị mkpọbi ụkwụ.

Ọmụmaatụ: Papa Pita patara pọpọ panye Papa Pọọlụ. Papa Pọọlụ pata pọpọ panye Papa Pita.

Ụkọchukwu Okechukwu kwuru okwuchukwu n’ụlọchukwi dị n’Arochukwu.

Nwaanyị na-akwa akwa ị na-akwa akwa na ọkụkọ yiri akwa n’elu akwa ị kwara akwa dị n’elu akwa.

GUO:  Agụmagụ odinala ndị Igbo

Kwa ụka kwa kọbọ kwa ụka kwa kọbọ kwa ụka kwa kọbọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here