Bishọọpụ Ezeokafor etoola Soludo maka ịkpọlite ndị ntorobịa n’ọrụ kọmishọna

0
10
Bishọọpụ Ezeokafor (n'etiti), onyeisioche otu NUJ n'Anambra, Odogwu Emeka (nke abọụ n'aka nri), osote onyeisioche otu NUJ n'Anambra, Ngozi Obileri (nke abụọ n'aka ekpe), na ụfọdụ ọzọ sonyere na njem mkpọtụrụ ahụ

...Tòó ndị otu NUJ Anambra

BISHỌỌPỤ ụka Katọliik na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor etoola aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Soludo maka itinye aha ndị ntorobịa n’aha ndị ahụ ọ kpọlitere ụfọdụ ndị ntorobịa dịka ndị ga-abụ Kọmishọna na steeti ahụ.

  Bishọọpụ Okafor kwupụtara otuto a ụbọchị Wenezdee oge ndịisi òtù ahụ jikọtara ndị mgbasaozi, a maara dịka ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’, ngalaba steeti Anambra gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọọrụ ya dị n’ụlọụka ‘Saint Patrick’s Cathedral, Awka’.

  Ọ dị ncheta na Gọvanọ Soludo nọrọ ụbọchị Tuzdee wee zigara ndị omeiwu steeti Anambra aha mmadụ iri abụọ ndị a ga-eme Kọmishọna ọhụrụ na steeti ahụ, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ntorobịa nọ n’agbata ahọ iri atọ na anọ na ahọ iri atọ na isee.

  Bishọọpụ Ezeokafor nọrọ oge ọ na-anabata ndị ntaakụkọ ahụ n’isi ụlọọrụ ya, wee kọwaa mkpọlite ahụ Soludo kpọlitere ndị ahụ dịka ezi nzọpụụkwụ kwesiri otuto.

  Ọ nọkwara ebe ahụ wee tòó ndị ntaakụkọ ahụ maka ezi mbọ dị icheiche ha na-agba na ụtụ pụrụ iche ha na-agba n’ịkwàlite mmepe obodo.

  Ọ kọwara ndị ntaakụkọ dịka ndị nwere ezi ọgụgụisi, ndị ji uche eme ihe, na ndị e kwesiri iñomi eñomi n’obodo; ọbụladị dịka o tòkwàrà ha maka etu ha siri mechaa nhọpụta ha mere na nsonso a n’ụzọ udo, n’ekweghị ka a hụta esemokwu maọbụ nwee akpọmasị maọbụ obi ilu ọbụla, ọbụladị ma oge e mechara ya bụ nhọpụta ọchịchị. Ọ dụkwazịrị ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ọdụ ka ha ñomie ụdị akparamagwa ahụ.

  Na mbụ n’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisioche ọhụrụ otu NUJ na steeti Anambra, bụ Dọkịta Odogwu Emeka Odogwu mere ka a mara na ebumnobi njem mkpọtụrụ ahụ bụ ka ha na Bishọọpụ Ezeokafor wee mara onwe ha n’ogoogo pụọhụrụ ahụ, ma kwalitekwuo ezi njikọaka ahụ dị n’etiti ha na ya kemgbe ọtụtụ ahọ. O kelekwara ya maka etu o siri bụrụ nnukwu onyeisi ụka na-eme ihe ọ na-ezi n’oziọma ma bụrụkwa onye anaghị akpa oke n’etiti ndị bụ ndị Katọliik na ndị abụghị.

GUO:  Fada Nwosu arịọla Bishọp Ezeokafor mgbaghara n'ihu ọha

  Ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ndịisi ụka ka ha ñomie Bishọọpụ Ezeokafor, ọkachasị site n’inwe ezi nkwuwa okwu megide ihe dị icheiche adịchaghị ka o siri kwesi na mgbe ihe anaghị aga etu o siri kwesi n’obodo.

  Ọ rịọkwazịrị ka ezi mmekọrịta ahụ dị n’etiti ndị ntaakụkọ steeti na Bishọọpụ ahụ bụrụkwa nke ga adịgide.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here