Egwu ndị Igbo: Egwu ifo

0
10

EGWU ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu a na-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo.

  Dịka anyị maara, akụkọ ifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha omenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga.

  A na-akọkarị akụkọ ifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike.

  Ọtụtụ akụkọ ifo na-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ a na-ekwe.

Ọmụmaatụ egwu ifo:

Mbe agaba………Ajambene

Mbe agaba……….Ajambene

Gaagaagaagaa     Ajambene

  Otu o sila dị, o nwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. O ji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile.

  Onye m na-ekwu maka ya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of the Order of Niger ‘(MON).

  Odogwu nwaanyị a kpara ike dị egwu n’egwu site n’afọ 1973 wee ruo n’ọnwụ ya n’afọ 2005.

  Egwu ya gụnyere: Aka Bụ Eze, Ezigbo Di m, Love nwantịntị, Ọna Bụ Nwunye m w.d.g

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here