Etiri m ya gwoogwoo, tụnye ya n’ụmị ka m ńụchara ọgwụ ike – Nwoke gburu nnukwu nne ya

0
9

NDỊ uweojii kọmandi steeti Kano anwụchikọọla otu nwoke gbara afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Naziru Mugagi nke Kununu Yalwa Danziyal dị n’okpuru ọchịchị Rimin Gado na steeti Kano, maka igbu nnukwu nne (grandmother) ya bụ Habiba Abubakar, gbara afọ iri asatọ ma tụnye ozu ya n’ochie ụmị, miri emi nke ukwu.

  Nke ahụ dị n’ozi nke onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ha na ọha na eze na steeti ahụ, SP Abdullahi Haruna Kiyawa kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na Kano.

  Ozi ahụ gbara ama na nwoke ahụ kwuru sị: “Etiri m ya ihe ma tụnye ya n’ime ụmụ miri emi nke ukwu, ka m ńụchara ọgwụ ike.”

  A gara n’ihu kọwaa na e wetara mkpesa site n’aka onye bi na Wangara, dị n’okpuru ọchịchị Tofa na steeti Kano.

  Onye uweojii ahụ kwuru na ka e nwetachara mkpesa ahụ, kọmishọna uweojii kọmandi steeti Kano, CP Sama’ila Shu’aibu Dikko zipuru igwe ndị ọrụ ya ma nye ha ntụziaka, onye nọ n’isi bụ CSP Isiyaku Mustapha Daura bụ ‘Divisional Police Officer’, Tofa.

  Dịka o siri kwu, igwe ndị ọrụ uweojii ahụ wụchara ebe ahụ ozigbo, gụpụta ahụ nwaanyị ahụ n’ụmị, ma buru ya gbaga ụlọọgwụ ọha na eze, Tofa General Hospital ebe dọkịnta nyochara nnukwu nne ya ahụ ma kwuo na ọ nwụọla.

  Okwuputa okwu ndị uweojii ahụ kọwara na dịka a na-eme nnyocha, nwoke ahụ kpara arụ kwuru na uche ya zuru ezu nke pụtara na ya enweghị nsogbu isi mgbaka; na nke bụ eziokwu bụ na ya tiri nnukwu nne ya ahụ gbara afọ iri asatọ ihe ma tụnye ahụ ya n’ụmị. Na ya kpara arụ ahụ ka ya ńụchara ọgwụ ike a na-akpọ ‘exto’. Nwoke ahụ gara n’ihu kwuputa na o teela ya jiri ńụba ọgwụ ike ma kọwaa na o teela nne ya ji adọ ya aka na ntị ka ọ kwụsi ajọ omume ahụ, mana ya jụrụ ịnabata ndụmọdụ ahụ.

  Otu o sila dị, okwuputa okwu ndị uweojii ahụ gbara ama na a hafeela okwu n’aka ndị na-ahụ maka arụ, Homicide Section of Command’s Criminal Investigation Department, nke ahụ gachaa, a ga-akpụpụ nwoke ahụ kpara arụ ụlọikpe.

  O kwuru na kọmishọna uweojii kọmandị steeti Kano adọọla aka na ntị na ndị omekome agaghị enwe ebe nzizo na steeti Kano. A dụrụ ha ọdụ ka ha chegharịa maọbụ hapụ steeti ahụ kpamkpam. Emeghị otu ahụ, a ga-anwụchikọ ha, mee ha ihe iwu kwuru.

  Ọ gakwara n’ihu kelee gọọmenti steeti Kano, ndị ezi mmadụ nọ na steeti ahụ, ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ‘Civil Society Organizations (CSOs)’ na ‘Community Policing Stakeholders’ maka ekpere ha, agbamume, nkwado ha na-enye oge niile na ezi mmekọrịta.

  Ọ kpọkuru ndị bi na steeti ahụ ka ha na-ekpere steeti ahụ, na ala anyị ekpere; ma ka ha na-ewega mkpesa n’ogige ndị uweojii dị ha nso, ka ha hapụ ịdị na-etinye okwu n’aka ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here