Na Borno, ndị ọrụ agha anwụchikọọla soja gbagburu mmadụ asaa n’ahịa

0
10

NDỊ ọrụ agha ala anyị (Nigerian Army), ekwuputala na ha anwụchikọọla onye soja maka igbu ndị nkịtị (civilians) asaa, nke gụnyere nwata nwaanyị gbara afọ atọ n’Mafa dị n’okpuru ọchịchị Borno.

  Ọ bụ Col. Obinna Azuikpe, (Intelligence Coordinator), Theatre Command nke Operational Hadin Kai (OPHK) kwuputara nke ahụ oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ‘military’s operations’ dị na North-East.

  Azuikpe kwuru na ihe dịka mmadụ iri na isii nwetara mmerụ ahụ na ya bụ ihe dapụtara n’ahịa Mafa. Ọ kọwara na e bugara ndị nwetara mmerụ ahụ ụlọọgwụ, ebe ndịuweojii ọrụagha (military police) nwuchikọrọ onye gbara egbe ahụ.

  Ọ gara n’ihu kwuo na ‘Theatre Commander’ ahụ, Maj. Gen. Christopher Musa agbala mbọ ịhụ na ndị agha ahụ nọgidesiri ike n’idebe iwu na mpaghara niile ha nọ ọrụ, dịka o kwukwara na kọmandị ahụ eguzobela ndị komitee e jikọrọ ọnụ ga-egozipụtakwa (review) usoro ọnọdụ ọrụ ha. Ọ rụtụkwara aka mbọ ndịisi ọrụ agha na-agba n’ịkwalite ọdị mma ndị agha ahụ nọ ọrụ ebe ahụ, dịka o kwuru sị; “Ihe ndị a gụnyere ịhụ na ndị soja anaghị anọkarị ọnwa atọ enwetaghị ikike ịga hụ ezinaụlọ ha. Anyị achọpụtala na ndị soja na-akpakarị agwa ọjọọ ma e debe ha ogologo oge. Chief of Army Staff, Lt-Gen Faruk Yahaya etinyekwuola ‘Welfare Flight Scheme’ maka ndị agha ahụ nke na izuụka abụọ ọbụla, a na-enye soja gara ebe tere aka dịka mpaghara ‘east’ ala anyị nkwado ka ha gaa na be ha dị iche iche.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here