NJINJI jiri ka ụlọ nke ọtụtụ klassị mejuputara dara n’otu ụlọakwụkwọ dị n’Ikang n’okpuru ọchịchị Bakassi dị na steeti Cross River, ma gbuo ụmụakwụkwọ anọ.
Ya bụ ọdachi ka e kwuru na ọ bụ mmiri ozizo ji oke ikuku kpatara ya ma bụrụ nke dapụtara oge ụmụakwụkwọ Diamond Grammer College, Ikang na-ele ule taam nke abụọ.
Otu onye nọ ka ya bụ ebelebe gburu, Okon Essien kwuru na oke ikuku nke so mmiri ozizo ahụ bịa kwaturu ụlọ ahụ. Dịka o siri kwu, ụmụakwụkwọ abụọ nwuru ozigbo ebe ahụ, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ ma bụrụ ndị e buru gbaga ụlọọgwụ dị nso. Otu o sila dị, o kwuru na ụmụakwụkwọ abụọ n’ime ndị ahụ e bugara ụlọọgwụ mechara nwụọ; nke mere ka dịzie anọ n’ọnụọgụ.
Essien kwuru sị: “Ahụrụ m ka a na-ebupu ozu ụmụakwụkwọ site n’ụlọakwụkwọ ozugbo ụlọ ahụ dachara. Ọnọdụ ahụ dị njọ n’anya. A malitere gbaba ọsọ nke na a zọbara ndị mmadụ ụkwụ (stampede). Mmiri ozizo ahụ mekwara ka nsogbu karịa n’ihi na o mere ka ịzọpụta ụmụakwụkwọ ndị tọkịịrị n’ụlọ ahụ dara ada sie nnukwu ike.”
Onye ọzọ nọ ka o mere, ma bụrụkwa onyendu obodo, Andrew Asuquo kpọkuru gọọmenti ka ha gbatara ezinaụlọ tufuuru ndụ ụmụ ha ọsọ enyemaka; dịka ọ rụtụkwara aka na ụfọdụ ndị mmadụ tinyere ndị obodo nọ na-enye aka kemgbe ọdachi ahụ mechara.
N’akụkụ nke ya, kọmịshọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ zuru oke (Quality Education), Maazị Godwin Amanke kwuru na ministrị ahụ, na onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ tinyere ụlọakwụkwọ ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ ọnụ iji gbochie ụdị ihe ahụ ime ọzọ.