Nwaanyị ọbụla kwesịrị ịgba mbọ aka ya – Nwaagbọghọ
na-arụpụta akpụkpọụkwụ

0
8

IGBO kwuru sị na ọkụkọ ga-abụ oke na -ebido n’eju. Ya mere, otu nwata nwaanyị na-eto eto, Charity Chinecherem Nweze, egosipụtala ihe ọ ga-abụ site n’ịbagide ọrụaka nke ọtụtụ mmadụ chere na ọ bụ sọọsọ ụmụnwoke na-arụ.

 Nwaagbọghọ ahụ gbara afọ iri na iteghete, onye Nkerefi dị n’okpuru ọchịchị Nkanu East na steeti Enugu akpaala ike site n’ịbagide ọrụ ịrụpụta akpụkpọụkwụ; ma si otu ahụ zipụta na ihe nwoke na-eme, na nwaanyị ga-eme ya tinye jara.

 Dịka o siri kwu, nne na nna ya gbahapụrụ ya na nwanne ya nwaanyị mgbe ha dị n’ụmụaka n’ihi na alụmdinanwunye ahụ ghasara nke mere na nna ya lụrụ nwaanyị ọzọ, ebe nne ya lụrụ di ọzọ. Ya mere, n’ihi ọnọdụ enweghị onye mgbaziri, ọ zọpụrụ ụkwụ ka dimkpa wee chọrọ ihe ọ na-eme

 Chacha, bụ aha e ji mara ya n’ahịa Ogbaete Enugu bụ ebe ọ mụrụ ọrụ  akpụkpọụkwụ kwebiri ịgbaso akaraka ya dịka o jisiri ike gụchaa akwụkwọ n’ogo sekọndịrị. Dịka o siri dị, mmetụta o nwere gbasara igbo mkpa ya mere ka ịmụ ọrụ dịrị ya mfe.

Otu o sila dị, Chacha kwuru sị na ọ ga-amasị ya ịgụ akwụkwọ gaa n’ihu ma ọ bụrụ na ọ dapụta; ma kwuo na ya nwere olile anya na Chineke ga-eme ya mgbe ya atụghị anya.

 Ọ gara n’ihu kwuo sị:” Achọpụtara m na Nigeria nke taa, nwaanyị ekwesịghị ịdabere kpamkpam n’onye ọbụla, iji wee dị ndụ. Ya mere kama m ga-abụ ibu arụ nye mmadụ, ekpebiri m ịmụ arụaka, iji nwete ego wee gụrụ akwụkwọ gaa n’ihu.”

 Otu o sila dị, o kwuru na ya adịla na mbụ mụọ ọrụ idozi isi, bụ nke doro ya anya nke ọma; ma kọwaa na ya mụrụ ọrụ ịrụ akpụkoọụkwụ n’ahịa Ogbete Enugu. O kwuru na onweghị onye si n’ezinaụlọ ya nyeere ya aka ịkwụ ụgwụ e ji amụ ọrụ ma otu o sila dị, ọ rịọrọ nna ya ukwu ka o jiri nwayọọ nwayọọ kwụọ ụgwọ ya. Ya mere, o kwuru na ya malitere mụba ọrụ ahụ ka ọnwa disemba dị n’abalị iri na abụọ n’afọ 2020, dịka ya lechara ule West African Examination Council (WAEC) na disemba 5. Tupu afọ 2021 abịa na njedebe na ya amụtachaala ọrụ, n’erughị otu afọ; ma malite ozugbo rụpụtawa akpụkpọ ụkwụ, nke ọtụtụ ndị mmadụ ọ kachasị ụmụnwaanyị na-abịa azụrụ ya.

 Ọ rụtụrụ aka na ịrụpụta akpụkpọụkwụ abụghị egwu a chị ụtaba n’aka agba. O kwuru na akọrọngwa e ji arụpụta ya dị ọtụtụ mana ya enweghị ha niile, nke mere na ya na-agakwuru ndị nwere ndị ya enweghị dịka igwe e ji akwa ihe (sewing machine); kwụọ ha ụgwọ wee mee ihe ya chọrọ. O kwuru na ya bụ ihe na-agbaghachi ya aka elekere azụ n’ihi na ya na-esi n’ụzọ ahụ na-atụfu uru ya ga-enweta.

 Chacha kwuru na ọ bụrụ na ya nwee ike gota akọrọngwa ndị ahụ na ọ ga-enyere ya aka ma kwalite ọrụaka ya ebe ọ dị ukwuu. O kwuru sị:” “Site n’amara Chineke, obụ m na-akwado onwe m ime ihe niile, ma ọdịghị mfe.”

 Otu o sila dị, o kwuru gbasara odịnihu ya sị na ya ga-achọ ịlaghachi azụ n’ụlọakwụkwọ, na ya chọrọ ịbụ onye ọkaiwu ma kọwaa na ihe o bu n’uche wee mụọ ọrụaka ahụ bụ iji nyere onwe ya aka n’ụlọakwụkwọ, na ọ bụrụgodụ na ya nwee onye nkwado, na ọ ga-eme ka ọ dịrị ya mfe.

  Ya mere, o nyere ụmụnwaanyị na-eto eto ndụmdụ sị: “Ọ bụrụ na nwaanyị ga-enwe ike kwụdoro onwe ya, nwoke agaghị enwecha ike ịkparị ya. Ọ bụrụ na-ị na-egboro onwe gị mkpa dịịrị gị, ị ga- enwe nnukwu ugwu, ọbụladị n’ezinaụlọ gị.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here