Onye NYSC adaala nwụọ ka ọ na-elele egwuregwu bọọlụ

0
9

ONYEISI (Director General), National Youth Service Corps (NYSC), Major General Shuaibu Ibrahim akasiela ezinaụlọ nwa nwoke ji otu afọ efe ala anyị, bụ onye dara ma nwụọ ka ọ na-elele egwuregwu bọọlụ n’ogige ọzụzụ (Orientation Camp) NYSC Kebbi.

  Onye ahụ ji otu afọ efe ala anyị, Musa Momoh Tunde, tuuru ugo n’ihe ọmụmụ Public Adminstration na Federal Polytechnic, Bida.

 Shuaibu kpọkuru ezinaụlọ onye NYSC ahụ lara mmụọ ka ha nabata ọnwụ ya ma ghọtakwa na ọnwụ bụ ihe ndapụta nwere ike ime oge ọbụla.

 N’ozi nkasiobi nke Ọkaiwu Ahmed Tijjani wetere, Onyeisi NYSC ahụ kọwara Tunde dịka nwa afọ Nigeria na-eto eto, nwụrụ ka ọ na-efe ala nna ya.

 Dịka o siri kwu, ọ nwụrụ ka ezi nwa afọ ala Nigeria, onye dị njikere ịtụnye ụtụ nke ya maka ọdị mma ala anyị; nke bụ ihe a ga-eji na-echeta ya.

 Nwanne Tunde lara mmụọ, Maazị Yahaya Mohammed, n’aha ezinaụlọ, kwuru na ha nwere nkasi obi n’ihi na Tunde biri ezigbo ndụ ma were ugwu na nsọpụrụ laa mmụọ.

 Otu o sila dị, e liri ya n’ogige olili ozu steeti Kebbi, dịka usoro ụka Alakụba siri dị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here