Ụlọ mposi na uru ọ bara

0
12

N’OGE gara aga, adịghị enwe ụlọ pụrụ iche maka ịnyụ nsị. Ọ bụ n’ọhịa na ụzọ ka a na- anyụ nsị. Ị na- aga n’ụzọ, ebe nile a na – esi sọ nsị nsị. Mmiri zoo, ide mmiri eburu nsi nile ahụ budaa na mmiri. Ọ bụkwa nke a mere ọrịa dị iche iche ji jupụta ebe nile, ọkachasi ọrịa afọ osisa nye ụmụaka na okenye.

  Ma mgbe amalitere lụba ụlọ ebe a na- aga mposi n’ime ya, ihe mgbanwe wee dịba na ndụ ụmụaka na okenye. Ụlọ mposi ahụ mere ka ihe ndị ahụ ide mmiri na- ebuba na mmiri belata. Ọzọkwa bụ mmiri ọñụñụ a gbapugasịrị ebe nile.

  N’ihi na ọtụtụ mmadụ agụbago akwụkwọ, amamihe sikwa otu a baa ụba. Onye jee mposi, ọ kwoo aka ya iji gosi  na- mmadụ ịdị ọcha bụ ahụ ike.

  N’oge udummiri, okwesiri ka ndị ọlụ na-ahụ maka gburugburu na- aga n’ogbe nile na- elebe anya otu ndị mmadụ si eme n’ihi n’agbanyeghị mkpu nile ndị ọlụ ahụ ike na – eti, ụfọdụ ka na- eru ịnyị. Ụfọdụ ka na – eje mposi, ekechi, etufu n’ụzọ dị iche iche.

  N’ihi nsogbu na ọghọm a na- enwe n’ ije mposi n’ezi na ụzọ nile, nke a mere ka e nwee ndị chịkọbara onwe ha ime ka onye ọbụla mara atụmatụ ịdị ọcha na mba ụwa. Otu a na-agbakwa mbọ a site n’ ịgbasa ozi ha n’ụlọ nta akụkọ na ụlọ mgbasa ozi nile.

  Otu a wepụtara abali iri na iteghete n’ọnwa iri na otu kwa afọ ọbụla ọ bụrụ ụbọchị aga na- eme mmemme icheta ụlọ mposi na mba ụwa nile. Ha kpọrọ ụbọchị ahụ ‘World Toilet Day’. Ọ bụ ụbọchị ndị otu a na- agbakọ ma nye nkuzi maka uru ịdị ọcha bara.  Ọ bụkwa ụbọchị ha ji eme ka mba ụwa mara na ahụ ike na- eme ka ọganiru, ụdọ na ọñụ baa ụba. Mgbe otu a gbara afọ iri na abụọ, ha meziri ya ka ọ bụrụ ihe a na- eme kwa afọ ọbụla.

  Ihe mmemme a akpọrọ ‘World Toilet Day’ bụkwa nke e mere n’ụbọchị Tuzdee gara aga. Isiokwu nke afọ a bụ ‘Nature-Based Solution’,nke pụtaraụzọ ọnatarachi a ga-esi wee hazie ya.

 World Toilet Day abụghị ndị gọọmentị nwe ya. N’oge mmemme a, ụfọdụ mba na – ahazi ya nke ọma site n’iji ihe ịkpa ọchị bido ya. Ha na-egosi egwuruegwu dị iche iche dịka ịgagharị n’ogbe, ịsacha ụlọ ebe a na-aga mposi na ihe ndị ọzọ site na mgbasa ozi iji dọta ndị mmadụ ka ha mara uru adịmọcha bara na ndụ mmadụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here