Uru nwa nwoke bara n’ala Igbo

0
12

NDỊ Igbo nwere nkwenye dị egwu na ezinaụlọ ọbụla ga-enwerịrị nwa nwoke. Ha kwetara na ezinaụlọ enweghị nwoke ga-ekpochapụ kpamkpam. Ọ bụ n’ihi nke a ka oge ụfọdụ, ezinaụlọ enweghị nwa nwoke ji ahapụ otu nwa ha nwaanyị n’ụlọ ka o nwee ike mụtara ha nwa nwoke ka o were lụbata nwaanyị n’ụlọ. Ọ bụkwa n’ihi amụtaghị nwoke ka e ji ahụta n’ezinaụlọ ụfọdụ, ebe nwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya. A lụbata nwaanyị ahụ, ezinaụlọ ahụ ahazizie ka ọ ga-esi na-atụ ma na-amụrụ ha nwa. Site n’ụzọ dị otu ahụ,a mụtara ezinaụlọ ahụ nwa nwoke.

  Ezinaụlọ ọbụla na-agba mbọ ịhụ na nwata nwoke ọbụla rugoro ihe e ji mmadụ eme lụrụ nwaanyị n’oge o kwesịrị; ka o wee mụta nwa ma si n’ụzọ dị otu ahụ mee ka ezinaụlọ tinyere obodo, na-aga n’ihu, ka aha na oke ezinaụlọ ahụ gharakwa ifu n’obodo. N’ala Igbo, ezinaụlọ enweghị nwa nwoke, enweghị oke n’obodo.

  Ha enweghị oke nke ha na-enwe onye na-ekwuru ha. N’ihi nke a, nwoke ọbụla torugoro ogo ịlụ nwaanyị, ma ọ lụghị nwaanyị a na-akpọ ya aha dị iche iche, ma na-ewekwa ya dịka ‘ofeke’ n’obodo o siri pụta. A na-agba izu ụfọdụ anaghị akpọ ya, ọ bụghịkwa ihe niile ka a na-akpọ ya ka o mee.

  N’ala Igbo, onye nwụọ ma ọ mụtaghị nwa ọ kachasi nwa nwoke enweghị ihe a ga-eji na-echeta ya. Ọ bụ nke a kpatara ndị Igbo ji aba aha ndị a: Obiefuna, Ahamefuna, Amaechina, w.d.g. Ha na-aba aha ndị a maka na onweghị onye chọrọ ka aha ya fuo.

  Ọ bụkwa n’ihi ọnọdụ a ka ezinaụlọ mụtara sọọsọ otu nwoke ji alụtara ya nwaanyị n’oge, A na-alụtara ha nwaanyị mgbe ndị ọgbọ ha amaliteghị lụba nwaanyị. Ha na-eme nke ahụ n’ihe egwu ọnwụ. Ha na-eche na ọ bụrụ na e mee ngwa ngwa, e meghara ọdachị. Nke ahụ pụtara ka ha lụọrọ nwa ha nwoke nwaanyị n’oge, ka ọ ghara ịnwụ n’amụtaghị nwa.

  Nwa nwoke izizi ọbụla a mụtara n’ezinaụlọ na-enwe ọkwa pụrụ iche, maka na ọ bụ ya bụ diọkpara n’ezinaụlọ ahụ. Ọ bụ ya ga-anọchi anya nna ya ma a chọọ nna ya ahụghị.

  O kwesịrị na diọkpara ọbụla ga-ama ihe ma na-arụsikwa ọrụ ike, nwee ezi agwa ma bụrụ onye nchịkọta.

  Ezinaụlọ na-ebido n’oge na-agbaziri diọkpara ụzọ ka chi ghara ijinarị ha, maka na diọkpara anya erughị ala na-aghasa ezinaụlọ. Ọ bụ nke a mere na ezinaụlọ maara ihe na-ebido n’oge hazie ma gbaziere diọkpara ụzọ ọ ga-eso bie ndụ ya dịka o kwesịrị. Ndị diọkpara na-alụkari nwaanyị n’oge, karịa ụmụnne ha ndị nwoke ndị ọzọ.

  A na-enwe mmekọrịta pụrụ iche n’etiti diọkpara na nna ezinaụlọ ọbụla. O nwee ihe nna na-eme nke adịghị ndị ezinaụlọ ya mma, ọ na-abụkarị diọkpara na-agwa ya maka ya. Ọ bụ nke a kpatara na oge ụfọdụ diọkpara na nna anaghị adịcha na mma; n’ihi na nna na-ebido chebe na diọkpara ya na-amazi ya aka n’ihu.

  Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ anwụọ, ọ bụ diọkpara ga-anọ n’isi akwamozu ya. Bido ụbọchị ahụ gawa, ọ bụ ya bụzi onye isi ezinaụlọ. Ọ ga-amalite rụrụ ọrụ gawa n’ihu, site n’ebe nna ya kwụsịrị. Ọ bụzi ya ka ọ dịịrị ilekọta mmadụ niile mejuputara ezinaụlọ.

  N’ala Igbo, anaghị edu diọkpara obi, ọ bụ ya na-enwe obi nna ya. Nke a pụtara na ọ bụ diọkpara na-ebichi na ngwuru nna ya. Ọ bụrụ na nna ya edughị ụmụ ya ndị nwoke ndị ọzọ obi tupu ọ nwụọ, ọ bụzi diọkpara ga-edu ha obi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here