Anambra agbatịkwuola oge mkpocha na nzacha Onitsha, Ogbaru na Idemili

0
6
Dọkịta Ibezim (n’etiti) na ụfọdụ ndị ọzọ soro ya gaa njem nleta ahụ

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra ekwuwaala na ọ na-agbatịwanyekwu ụbọchị a ga-eme mkpocha na nzacha ahụ na-aga n’ihu ugbua na mpaghara obodo dịgasị n’okpuruọchịchị Onitsha North, Onitsha South, Ogbaru na Idemili North dị na steeti ahụ.

  Ya bụ ọrụ mkpocha na nzacha gburugburu na ọwàmmiri bụ nke bụ nke gọọmenti steeti ahụ malitere na mpaghara ahụ n’isi ngwụcha izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji mee ka gburugburu ebe ahụ chawapụ ma mekwa ka mmiri na-agara onwe ya siriri-werere n’ọwàmmiri, bụkwa nke unyi na ahịhịa sụchiri, nke na mmiri anaghịzị ahụ ebe ọ ga-esi gaa, wee na-emetọsị ala ebe ahụ.

  Nke ahụ wee bụrụzie nnukwu ihe iche aka mgba nye ọnọdụ ahụike ndị bi na ndị na-azụ ahịa na mpaghara ebe ahụ, nke mezịrị gọọmenti jiri kpebia ịbagide n’ọrụ mkpocha n’ebe ahụ, bụkwa nke e kwubụrụ na ọ ga-adị mkpụrụ ụbọchị olenaole.

  Kaosiladị, n’okwu ya oge ọ gara njem nleta ọrụ n’ebe ahụ na nsonso a, onye na-ahụ maka ọrụ ahụ, ma bụrụkwa osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ya bụ ọrụ si aga na ebe ndị e kpochasịgoro. Ọ nọzịkwara n’ebe ahụ wee kwuwaa na gọọmenti na-agbatịwanyekwu atụmatụ mkpocha na nzacha ahụ, ka ọ bụrụzịe nke ga-adịgide ruo mgbe e kpochasịrị ihe niile bụ unyi na gburugburu ebe ahụ, ebe niile e wee chawapụ.

  Dọkịta Ibezim, onye gagharịrị na gburugburu ebe ahụ ịhụ ka ọrụ si aga, mekwazịrị ka a mara na ọ bụ ihe dị ezigbo mkpà na a gvatịwanyekwuru oge ọrụ ahụ, ka e wee kpochasịa gburugburu ahụ n’ozuzuoke, maka na ọ bụ nke ahụ bụ isi sekpụ ntị gọọmenti jiri malite ya bụ ọrụ.

  O kelekwara ndị bi na mpaghara ahụ maka etu ha si kwàdo ma nye aka hụ na ọrụ ahụ na-aga nke ọma; ọbụladị dịka ọ dụkwara ha ọdụ ka ha gharakwa ime ihe ọbụla ga-adọghachi aka elekere azụ n’ọrụ ahụ, ka e wee hụ na a rụchara ya nke ọma na n’oge kwesiri ekwesi.

  Otu onye n’ime ndị na-ere ahịa na gburugburu ebe ahụ e kpochasịgoro, bụ Maazị Ferdinand Anozie kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka ya bụ ọmarịcha atụmatụ ọrụ mkpocha na nzacha, ma gbaa akaebe na ha na-ekuruzị ezigbo ikuku ugbua ma nwekwazie ike ịnọsapụ ahụ na gburugburu ebe ahụ ugbua n’enweghị ísì ọjọọ ọbụla chụrụ ha maọbụ kòjuo ha imi na afọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here