CP Anambra ekesàárala ezinụlọ ndị uweojii nwụrụ anwụ ego nkwàdo

0
7
CP Echeng Echeng (nke atọ n'aka ekpe), onye ọrụ uweojii (nke anọ n'aka ekpe), na ụfọdụ ndị soro keta òkè n'ego ahụ.

ONYEISI ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng nọrọ na nsonso a wee kesàárá mmadụ iri na atọ, bụ ndị ezinụlọ ndị ọrụ uweojii nwụrụ n’ọrụ uweojii n’ime steeti ahụ akwụkwọ ndọrọ ego nkwàdo ruru nde naịra iteghete na ụma atọ (₦9,300,000).

  Ego ahụ bụ nke CP Echeng kesàrà nye ndị ahụ n’aha onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali, ma bụrụkwa e mere n’okpuru atụmatụ ‘Inspector-General of Police Family Welfare Insurance Scheme’, nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ezinụlọ ndị uweojii ahụ nwụrụ n’ọrụ site n’inyere ha aka.

  Atụmatụ ahụ bụkwa nke na-enye aka ịkwalite mmụọ na ọnụnụọkụnobi ndị uweojii ka ha na-arụsi ọrụ ike, burukwa n’obi na ụlọọrụ uweojii bu ọdịmma ha na ndị ezinụlọ ha n’obi.

  Ka ọ na-ekesara ndị ahụ akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, CP Echeng kelere onyeisi ndị uweojii, bụ IGP Akali maka ezi agbambọ ya n’ịkwàlìtè ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ uweojii na ndị ezinụlọ ha. Ọ dụkwàzịrị ndị ahụ o kesaara ego ahụ ọdụ ka ha tinye ya n’ihe ga-abara ha uru ma ritekwara uru ha ga-eji zụọ ụmụ ha, karịa ịga mefusie ya n’ihe abaghị uru.

  O kwukwazịrị na ha bụ ndị uweojii na steeti ahụ ga-aga n’ihu ịrụsi ọrụ ha ike iji weta udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ, nà n’ala Nigeria n’izugbe.

  O mekwara ka a mara na ha nwetekwara ụdị akwụkwọ ndọrọ ego dị etu ahụ site n’aka IGP Akali n’ime ọnwa atọ gara aga, bụkwa nke o kesààrà ndị ritere uru na ya.

GUO:  E nweela nnukwu ọganihu n’Anambra kemgbe e kepụtara ya

  Ndị dị icheiche soro kete ago ahụ kelere IGP Akali na CP Echeng maka ya bụ ego nkwàdo, ma kwe nkwa itinye ya n’ihe bara uru, jirikwa ya mepụta ihe a hụrụ anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here