Di m gburu nwa ọhụrụ anyị – Nwagbọhọ nwa ya nwụrụ

0
6

OTU nwa na-eto eto, ma bụrụkwa onye nne gbara afọ iri na asaa, Promise Okon, agbaala ama otu di ya bụ, Benedict Anieze si jaa nwa izuụka anọ ha n’ala, ọ nwụọ. Ya bụ ọdachi mere n’ebe obibi ha, mpaghara Idimu Lagos.

 A chọpụtara na di na nwunye ahụ nwere nghọtahie nke mere na nwoke ahụ ji iwe jaa nwa ọhụrụ ahụ n’ala, isi ya gbarie.

 Dịka Promise Okon siri kwu, “Ya bụ ihe mere n’ebe anyị bi, 5 Pipeline Road, Idimu oge anyị na-enwe nghọtahie, di m tụrụ nwa anyị nwaanyị dị otu ọnwa n’ala. Ọ nwụrụ n’otu aka ahụ, ozigbo o tinye ụlọ anyị ọkụ. Ọ bụ ndị agbataobi nyere aka menyụọ ọkụ ahụ.”

 Otu o sila dị, a chọpụtara na ka nwoke ahụ jachara nwa ọhụrụ ahụ n’ala,  ọ nwụọ, ọ gara n’ihu itinye ụlọ ọkụ tinyere nwunye ya na-ebe akwa, na ozu nwa ya nọ n’ime ya. E wepụ ndị agbataobi gbatara ọsọ enyemaka wee zọpụta Okon, menyụọ ọkụ ahụ, ọ gaara agbagbu ya ka ọ ka na-agbake afọ a wara ya otu ọnwa gara aga, ka ọ na-amụ nwa.

 E wetara mkpesa ahụ n’ogige uweojii Idimu nke mere ka a nwụchikọọ nwoke ahụ kpara arụ. Ka a na-agba ya ajụjụ, nwoke ahụ kwuru na ọ bụ ajọ mmụọ bara n’ime ya wee kwakanye ya n’ime ihe ya mere.

 Dịka ọ na-ekwu na ya bụ ihe mere eme n’ezie, okwuputa okwu ndịuweojii steeti Lagos, SP Benjamin Hundeyin kwuru na nnyocha na-aga n’ihu, tinyere na a na-eleba okwu ahụ anya dịka igbu ọchụ na ịgba ụlọ ọkụ.

 A hafeela nwoke ahụ kpara arụ n’aka ndị ọ dị n’aka, Steeti Criminal and Investigation Department (SCID), Panti Yaba.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here