Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua

0
9

IGBO kwuru sị na nwa bụ nwa ọha. Nke a pụtara na ọnọdụ ịdịmma ụmụaka dịịrị ọhaneze. Ya mere, onye ọbụla na-etinye aka n’ịzụlite ụmụaka. Ọ bụ nkwenye a mere na n’oge gboo, mgbe ezi dị n’ukwu ụkwa, mgbe elu bụ ala ọsa ikwunaibe, agbataobi, ndị enyi na ọtụtụ ndị ọzọ na-etinye aka n’ịzụlite ụmụaka.

  N’oge ahụ, okenye ọbụla hụrụ nwata ka ọ na-eme ihe ọjọọ ga-abara ya mba, ọ bụrụ nke ọ ga-eji tie ya ihe o tie ya. Nwata ahụ ga-anabata nkuzi ahụ e nyere ya n’obi ọcha ma soro nzọụkwụ dị mma. Nwata ọbụla na-eme ihe ọjọọ n’oge ahụ na-akụja ma ọ hụ okenye n’ihi na ọ maara na ọ ga-elebara anya n’ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme. Onweghị mgbe e ji ahapụrụ sọosọ nne na nna ka ha na-enye ụmụ ha ọzụzụ. N’oge ahụ, nwaanyọ chọọ ịkwụsị nwa o ku n’aka ara ọ kpọlaara ya nne ya.

  Ọtụtụ ụmụaka na-eme, ha kwụsịchaa ịńụ ara ha na nne ha ochie ebirizie, ha ewee bụrụ mmadụ. N’aka nke ọzọ, nne na nna na-akpọgara ndị mụrụ ha ụmụaka ka ha na ha biri; nke a na-adị mma maka na ndị nnukwu nne na nna bụ ochie dike, ha taa akụ a hụ ichere ya. Nke a mere na ị hụ nwata nnukwu nne maọbụ nnukwu nna ya zụrụ, ihe dị iche na-adị na ndụ ya n’ihi na ọ na-ama anya e lere ele na nke a rọrọ arọ.

  Ndị ọzọ na-enyekwa aka n’ịzụlite ụmụaka n’oge ahụ bụ ndịnkuzi n’ihi na ndị mmadụ na-enwe ezi ntụkwasa obi n’ebe ha nọ, n’ihe gbasara ịzụlite ụmụaka. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-akpọnye ndịnkuzi ụmụ ha ma rịọ ha ka ha zulite ha n’amamihe. Ọbụladị n’ụlọakwụkwọ, ndịnkuzi na-enye ụmụaka ntaramahụhụ kwesịrị ihe ha mere. Nne na nna na-anabata ya ma kelee onye nkuzi ahụ, ebe ọtụtụ n’ime ha na-eji aka ha kpesara onyenkuzi banyere ihe ọjọọ nwa ha na-eme, ma rịọ onyenkuzi ahụ ka o lebaa ya anya ma gwọọ nwata ahụ ịba. N’oge ahụ, nne na nna na-enye onyenkuzi ihe onyinye ọ kachasị n’oge owuwe ihe ubi, iji kelee ha maka ọzụzụ ọ na-enye nwa ha.

  Ọ bụrụ na nwata emee ihe ala na-asọ nsọ, dịka izu ohi maọbụ ịtụ ime mkpuke, nne na nna na-eme ka ụmụnna mara banyere ya, ha na-ejikọ aka ọnụ tụọ aro wee kpebie ihe a ga-eme. Ịmaatụ, o nwere otu nwata nwoke zuru ohi, nne na nna ya gbara mbọ ịjụpụta ya ebe o dobere ego o zuru n’ohi ma o nweghị isi, ha kpọọ ụmụnna, n’ikpeazụ ụmụnna kpọtara mmọnwụ ọ nyụọ nwata ahụ ịkpakwụ, o kwuo ebe o zoro ego ahụ ma kọwaa ka ya na ije siri je.

  N’otu aka ahụkwa, nwata nwaanyị tụọ ime mkpuke, ụmụnna na-ajụpụta ya nwoke debere ya n’ọnọdụ ọ nọ. Ha chọpụta nke ahụ, ha nwere ike manye nwoke ahụ ka ọ lụba ya maọbụ ha atụọ arọ ụzọ ọzọ a ga-esi leru nwata nwaanyị ahụ anya.

GUO:  Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua (2)

  N’oge ahụ, ọ bụladị nwata nwaanyị na-achọ ịla be di ya, a na-akpọpụ ya be nne nwaanyị ọzọ ebe ọ ga-anọ mụọ ka e si ebi na be di. Ihe ha na-akpọ nke ahụ bụ ‘ije ọzụzụ’. Nwata nwaanyị ahụ ga-anọ ọzụzụ ahụ ọnwa ole ọbụla e kpebiri na ọ ga-anọ.

  Ebe ahụ ka ọ ga-anọ mụta ọtụtụ ihe banyere ibi obi ezinaụlọ ndị gụnyere otu e si esi nri, aza ụlo, ileru di na ụmụaka anya w.d.g. Onweghị onye na-ala be di ya ma ọ gaghị ọzụzụ ahụ. Nne nwaanyị a na-akpọgara ụmụagbọghọ ka ha zụọ bụ ndị maara ihe ekwe na-akụ, ndị ha na di ha na-ebi nke ọma, ma bụrụkwa ndị ndụ ezinaụlọ doro anya. Ọ bụ nke a mere na tupu nwata nwaanyị alaa be di ya ọrụ ezinaụlọ edoo ya anya, alụmdinanwunye ha a na-aga sịrịịrị werere. Nke ha emeteghị nke ọma, ndị ọzọ nọ n’akụkụ ha enye aka gbaziere ha.

  Ma n’oge ugbu a, ihe agbanweela, isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya. Ọtụtụ ụmụaka anaghị anụkwa ndụmọdụ nne na nna ma ya fọdụzie nke ikwunaibe. Ọzụzụ ụmụaka laziri n’aka sọọsọ nne na nna. Ndị ọzọ anaghị enwezi ọnụ okwu n’ebe nwa abụghị nke ha nọ. Ọtụtụ ndị mmadụ eburula nsogbu n’ihi na ha chọrọ ịgbaziri nwa onye ọzọ. Ụfọdụ nne na nna ka ọ ga-abụ onye agbataobi tie nwa ha ihe maka na o mere ihe ọjọọ, ha abịa ọgụ; a na-ekwu ka a na-ekwu ha akpọọ ndị uweojii. Ọnọdụ a meziri na ụmụaka na-efuzi ụzọ n’ike n’ike. Ụfọdụ ka a na-ejide ka ha na eme ihe ọjọọ dị iche iche gụnyere ise anwụrụ ike, ịchụ nwaanyị w.d.g, ma onweghị onye ga-ekwu okwu maọbụ kpesara nne na nna ha, maka na onye kwuo ọ bụrụ na ọ na-emebi aha nwa mmadụ.

  Ọnọdụ a meziri na ụmụaka anaghị asọzi okenye anya wee na-eme ihe ọjọọ. Ha na-anọ n’ihu okenye rụọ ala dị iche iche, onye kwuo ha akparịa ya maọbụ tụọrọ ya ọgụ.

  Ọnọdụ a jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkapị n’isi. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ụmụaka anaghị asokwuzi nne na nna ha anya, nke mere na ọzụzụ ụmụaka siziri nnukwu ike.

  Taa nne na nna anaghịzị eji ike akpọnye nne na nna mụtara ha ụmụaka ka ha leruo anya soro zụọ ha, dịka ọ dị oge gboo. Ihe nne na nna na-emezi bụ onye mụọ nwa o tinye ya n’ụlọ akwụkwọ ozugbo, ha ga na-ebuga ha akwụkwọ na-ebụlọta ha. Onweghịzị ohere ụmụaka nwere ịnọ n’ụlọ mụta ka e si eje ozi ụlọ. Ụfọdụ nne na nna bụkwa ndị na-ama ụzọ pụọ n’ihi ka ọrụ ha siri dị, ha lọta n’abalị ha na ụmụ ha alabaa ụra, ụtụtụ ha niile amanyekwa isi n’ọhịa. O wee bụrụ ya, ọnọdụ a emeela na ọtụtụ ezinaụlọ anaghịzị eleru anya n’ụlọ, oge ụfọdụ ha agaghị esi nri kama ha were ego ha ekee ụmụaka sị ha were goro ihe ha ga-eri. Ọ bụ ụkwụ a ka nama ga-eji ru Umuahaia? Ọ dị egwu, mmiri siri n’isi were gbarụ.

GUO:  Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua (2)

  N’akụkụ ndị nkuzi, efe enyeghịzị. Oge agaala mgbe nne na nna na-arịọ onye nkuzi ka ọ zụọrọ ha ụmụ. N’ụwa taa, ọtụtụ nne na nna amanyela ndị nkuzi ọgụ maka na ọ pịara nwa ha ụtalị n’ụlọakwụkwọ. N’otu aka ahụkwa, ọtụtụ ụmụakwụkwọ agbaala izu tie ndị nkuzi ihe maka na ọ pịara ha ụtalị; ebe ụfọdụ ndị nkuzi tufukwara ndụ ha maka nke ahụ. Ndị nkuzi na-azọzị isi onwe ha. Ha na-ezezi ndụ ka ha ghara ikoro okwu.

  Ọtụtụ ụmụaka nwoke, yaabụ ụmụakwụkwọ ndị lara n’iyi na-arịọ ndị nkuzi ụmụagbọghọ enyi. N’ọnọdụ ahụ ọtụtụ ndị nkuzi na-eji nwayọọ na-eso ha maka ha kwusie ike maọbụ nye mkpesa, ụmụaka ahụ akpọọro onye ahụ ndị otu ya, ha emesie ya ike. Olee otu a ga-esizi kwọ onye ukwu wara?

  Dịka ndị gboo na-ekpesara ọha na eze na nwa ha mere arụ, n’ụwa taa ọtụtụ nne na nna na-ekpuchi ụmụ ha ma ha mee ihe ala na-asọ nsọ.

  Ọtụtụ n’ime ha ka ọ na-abu onye nwa ya zuoro ohi, ọ zochitebe ya, ma kwuo na ọ bụ ebubo ka a na-ebo nwa ha. Otu nwoke ka nwa ya nwoke zuru ohi ọgbatumtum, bulata ya zoo na be ha, mgbe okwu ahụ pụtara ihe, nwoke ahụ gọrọ agụgọ na nwa ya abughi onye ohi na ọ bụ ndị uro ya chọrọ imebi aha ya. Ma n’ikpeazụ, gborokpoto gbara n’ihu ehi.

  N’otu aka ahụkwa, ọtụtụ nne na nna na-ezo ụmụ ha ma ha tụrụ ime mkpuke, ọtụtụ ka ọ na-abu ha choputa na nwa ha nwaanyi tụtara ime, ha akpọpụ ya obodo tere aka mgbe onwebeghi onye chọpụtara na o dị ime. Nwata nwaanyi ahụ ga-anọgide ebe ahụ wee mụọ nwa. Ozigbo ọ mụrụ nwa, ha eree nwa ahụ nara ego tinye n’akpa, nwa ha etirikwa  agbọghọ na-akpaghari n’enwegghi onye ma. Ufodu  nne na nna na-akpa arụ site n’ikwuchitere ụmụ ha na-eche na ha na-emere ha ihe ọma, ha amaghị na ha na-egbu ha egbu; ma ha amaghịkwa na ukpala na-ere ọkụ kwuru na ọ bụ mmanụ ka ya na-asu. Ihe ọjọọ nwere ụgwọ, nke onye obula mere ya ga-anata.

Mgbe ha na-akpa ụdị agwa ahụ ka ha na-agba ụmụ ha ume ka ha kpara arụ na-aga n’ihu. Akụkọ kọrọ na otu nwata nwaanyi nọ mahadum turu ume n’ulọakwukwọ ahụ, zoo ya nke na nne na nna ya achọputaghị, ọ bụzi ozugbo ọ mụrụ nwa ka ama gbaara nne na nna ha banyere ihe merenụ.

GUO:  Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua (2)

Nne nwaakwụkwọ ahụ garuru n’ebe ahụ nwa ya mụrụ nwa kpọrọ ya, gbahapụ nwata  a mụrụ ọhụrụ laa n’ihi na o kwuru na ndị ụka ha ga-anapụ ya ọkwa o ji n’otu ndị nne ma ha chọpụta na nwa ya tụrụ ime mkpuke. Nke a bụkwa arụ kwọ nwa! Mmadu ọ na-ajụ onyinye chukwu, o kwesiri ikpọrọ nwa ya na nwa ọhụrụ ahụ laa n’ụlọ, nwa mahadum ahụ nọọ n’ulo otu afọ ma ọbụ abụọ zụchaa nwa, ọ mụrụ akọ; echi niile ọ kpaa agwa ka mmadụ.

O were bụrụ ya, otu a ka nne nwaanyi siri tufuo nwa nwa ya, onye ọzọ bia kwụọ ụgwọ kuru nwa ọhụrụ ahụ laa, ọ bụrụzie nke ya. ọ dị egwu, mmiri esila n’isi gbarụọ, n’ihi na uwa emebiela, onye ga-agbaziri mmadu na asi ya jisi ike mebe mpụ.

  Ihe ọzọ mere ọzụzụ umuaka ji nye nnukwu nsogbu n’oge ugbu a bu ekwentị. Ọtụtụ nne na nna na-enye ụmụaka ohere inwe ekwentị mgbe ha erubeghị ogo. Ọnọdụ di otu a mere na ọtụtụ ụmụaka anaghi anụkwa ihe nne na nna na-ekwu. Oge ọbụla ha na-api ekwentị, I zie nwata ozi ọgaghi eje ozi ahụ n’ihi na ekwenti anarala ya uche. He esikwala na ya mụta arụrụala dị iche iche, nke mere na mpụ na-arizi elu n’ala anyi.

  O were bụrụ ya, ozụzụ ụmụaka esịla n’aka oha na eze banye n’aka nne na nna, ma sikwa n’aka nne na nna puzie nke na amakwaghi ihe a ga-eme. Nne na nna kwesiri ike aji n’ume zụọ ụmụ ha dịka o kwesịrị, ihe amaghi ihe e mere ya bụ ọnwụ, na nwa akariala m bụ aghụghọ. Onye ọbula leruo nwa ya anya, nke ị maghi ihe i ga-eme ịkpọnye ya onye ichere ga-eme ya ka o baa uru ma bụrụ maadu n’ọdinihu.

  Ọzọ dị ka ibe ya bụ na nne na nna ga-enye ọha na eze ohere ka ha tinye aka n’ịzụ ụmụaka. Nke a ga-eme ka ndị onkenye nwekwaa nsọpụrụ n’ebe umuaka nọ n’ihi na ọtụtụ n’ime ha chiri onwe ha eze onye agwana m. Onye nụ na nwa ya kpara arụ, ya mee ezi nnyocha banyere ya ma gbaa okwu n’anwụ n’abịaghị kpuchibe onye mere arụ. Ụmụaka bụ uto ntochị dika e si ekwu, ya mere ka a gba mbọ wepụ aka enwe n’ofe, tupu ọ ghọrọ aka mmadụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here