N’Imo, ndị ojiegbe akpaala mkpamkpa n’Orsu

0
7

NDỊ oji egbe atụnyela ihe mbigbọ nke gbariri isi ụlọọrụ   okpuru ọchịchị gọọmenti Orsu, nke mere ka ngwongwo na ngwongwo juputara n’obi gọọmenti ahụ ghọọ ntụ; ma bụrụ nke gụnyere ụgbọala a kwụbachara n’ogige ụlọọrụ ahụ.

 Otu onye bi n’ogbe ahụ, Chibuzo Ukah kwuru na ya bụ mwakpo nke e mere ụbọchị ụka n’ihe dịka mgbe o ji ọkara gafee elekere abụọ nke ụzọ ụtụtụ kpatara nnukwu egwu na mpaghara ahụ dịka ọtụtụ ndị mmadụ gbapụrụ n’ụlọ ha dị iche iche, ka nke ahụ na-eme.

 O kwuru sị na ụlọ Onyeisioche na ụlọ isi ọnọdụ ndị ọzọ (administrative blocks), tinyere ụgbọala ndị a kwụbachara ebe ahụ ghara ọkụ.

 Onye ọzọ si n’ogbe ahụ, achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na Orsu nọ na nsogbu kemgbe n’ihi mkpamkpa ndị oji egbe na-akpa ebe ahụ, nke mere ndị mmadụ enweghị ohere ngagharị dịka o kwesịrị, ọ kacha ndị ntorọbịa.

 O kwuru sị;” Dịka Orlu siri dị ọkụ kemgbe n’ihi nsogbu ndị oji egbe, Orsu abụrụla ebe anaghị aga aga n’ebe ndị ntorọbịa nọ.”

 Otu o sila dị, okwuputa okwu ndị uweojii na steeti Imo, Maazị Micheal Abattam, oge akụkọ ji ru anyị aka kwuru na ya anụbeghị banyere ọnọdụ ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here