Nwakpo ụgbọoloko Abuja-Kaduna: Ndị mmadụ na-akwa arịrị maka Dọkịnta Chinelo

0
6
Nwando lara mmụọ

NDỊ mmadụ na-aga n’ihu na-akwa akwa arịrị ma na-akatọ mkpamkpa ndị ọjọọ kpara n’ụgbọoloko bu ndị njem agba n’ụzọ; ma bụrụ nke wetara ọdachi, ọnwụ na ihe mbibi dị iche iche. Ọtụtụ ndị ọnụ ruru n’okwu etiela ebewu n’ihi nke ahụ, ebe ụmụ ogbenye nọ n’ụlọ na-asụ ude.

  Ụwa niile kọwara ya bụ ọnọdụ dịka ihe ịgba anya mmiri. Ọtụtụ agbụrụ, tinyere ezinaụlọ dị iche iche ketere oke na ya, nke mere na o tinyere ndị mmadụ na gbagharịa.

  Otu onye n’ime ndị tụfuru ndụ ha n’ọdachi ahụ bụ Dọkịnta Chinelo Megafu Nwando, gbara afọ iri abụọ na isii , gụrụ ihe ọmụmụ dibịa oyibo na-ahụ maka eze (dentist) ma bụrụ onye Onitsha dị na steeti Anambra.

 Dọkịnta bụ onyeisi (Medical Director) n’ụlọọgwụ St Gerard Catholic Hospital, Kaduna kwuru na e mechara hafee mmadụ iri na otu n’ime ndị ahụ merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Army Referral Hospital n’ihi oke ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya. Ọ gara n’ihu kwuo na mmadụ abụọ n’ime ndị ha hapụrụ n’ụlọọgwụ ha, mechara nwụọ. Otu n’ime ha bụ Chinelo, onye o kwuru na ha lekọtara ya anya n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na ọ bụ otu n’ime onye ọrụ ha. Ọnwụ ya mere ka ndị ọrụ niile n’ụlọọgwụ ahụ banye n’ọnọdụ iru ụjụ.

  Chinelo, onye e kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị ya na Queens College, Lagos tupu o turu ugo n’ihe ọmụmụ ịhụ maka eze na mahadum University of Port-Harcourt, steeti Rivers n’afọ 2015/2016, fee ala anyị, National Youth Service Corps na Kaduna State Dental Centre ma rụọ ọrụ afọ olemole na St Gerard, ka o fechara ala anyị. Ọ rụrụ ọrụ n’okpuru Rev. Sista Beatrice Danladi, tupu o tinye akwụkwọ ịkwụsị ọrụ iji nwe ike malite ọrụ n’obodo oyibo. Ọ kwadochaala ịgafe obodo oyibo tupu ọdachi ahụ a dapụta.

 Ozi sitere n’aka Nigerian Medical Association kwuru sị: “Onyeisi NMA, Ọkammụta Innocent A. O. Ujah ma tinyere ndị ọrụ ahụike ‘Medical and Dental Pratitioners’ n’okpuru NMA nọ n’oke nwute n’ihi ọnwụ ntụmadị nke onye otu anyị, Dọkịnta Chinelo Megafu Nwando.”

 Ozi ahụ gara n’ihu katọọ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa nke na-arị elu n’ala Nigeria ugbu a, nke bụ na ndị agha ọ lụọ ọ laa, ndị ntọrị, ndị omekome na ndị ọzọga, na-awakpo ma na-egbu ebelebe dị iche iche n’ala Nigeria oge niile; ma site n’ụzọ dị otu ahụ na-ebutere ndị mmadụ ihe oke mgbu na mwute. Ọ rụtụrụ aka na ọnwụ erughị eru nke Dọkịnta ahụ ka na-amalite amalite, na-agba mbọ ịrụ ezi ọrụ, bụ nnọọ ọnwụ ruru n’ahụ.

 N’ozi nke ya, Gọvanọ steeti Anambra, Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo akasiela ezinaụlọ Dọkịnta ahụ lara mmụọ na ndị otu Nigerian Medical Association obi, maka ọnwụ onye otu ha n’aka ndị ọjọọ. Ọ kọwara ihe banyare ọnwụ ya dịka ihe mgbawa obi.

 Otu onye ọrụ n’ụlọọgwụ St Gerard gbara ama na e nyere ya ọrụ n’ụlọọgwụ ahụ ka a chọpụtara na o mere nke ọma n’ụlọọgwu ebe o mere NYSC, na Kaduna. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ kwụsịrị ọrụ ahụ n’ọnwa gara aga dịka nne na nna ya kpọrọ ya ka ọ bịakwute ha na Canada. Ya mere na ọ gara Abuja maka ịhazi akwụkwọ ọpụpụ ya, na ọ bụzi ka ọ na-alọghachi n’ụgbọoloko ka e gburu ya. O kwuru na ọ gaara agawa Canada na ngwụcha izuụka.

  Nnukwu Onyeisi (Chief Medical Director), St Gerard Hospital, Dọkịnta Shurkuk Cletus Bako gosipụtara oke mwute maka ọnwụ mberede Chinelo, onye ọ kọwara ka otu n’ime isi a hụrụ kwaa okpu n’ebe ahụ, tupu o tinye akwụkwọ maka ịkwụsị ọrụ, ihe dịka otu ọnwa gara aga. Ọ kwukwara na ọ na-akwado ịga obodo oyibo maka ịgụrụ akwụkwọ gaa n’ihu ma bawanyekwa amamihe n’ọrụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here