Okpoko: A gwala ndị rụgasịrị ụlọ ebe ekwesighị ka ha kụtuo ha

0
5
Ụfọdụ ụlọ ndị ahụ a kàrà ákàrà nkụ́tù na ndị sonyere n'ọrụ ịnye ákàrà ahụ n'Okpoko

ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka nhazi ewumewu ụlọ na steeti Anambra, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board (ASPPB)’ akpọkuola ma dụọ ndị dị icheiche rụrụ ụlọ n’ebe okporoụzọ na ọwàmmiri gara ka ha kụtusie ụlọ ahụ n’oge adịghị anya.

  Onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’, bụ Maazị Chike Mmaduekwe bụ ya kpọrọ oku a oge ya na ndị òtù ọrụ ya gara inye ákàrà ịdọ aka na ntị n’ụlọ ndị ahụ dịchisiri ụzọ n’Okpoko, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ogbaru ka ha kụtuo ulọ ndị ahụ n’ụzọ, n’ihi nnukwu ọrụ ahụ gọọmenti chọrọ ịbagide na mpaghara ebe ahụ n’oge adịghị anya.

  Ọrụ inye akara mwepù n’ụlọ ahụ bụ nke a malitere na nsonso a, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee hụta ma nye akara n’ụlọ karịrị narị abụọ n’ọnụọgụgụ dịka ụlọ ndị mmadụ a ga-akụkpọ na mpaghara ahụ n’ihi na ha dị ebe ekwesighị ekwesi wee na-egbochi mmiri na idè mmiri ịgara onwe ya nke ọma na ihubànyè n’ime Ohimiri Naịja (River Niger).

  Maazị Mmaduekwe kọwara na etu ndị mmadụ siri rụchisi ụlọ n’okporoụzọ na n’ebe ọwammiri so n’ihe kachasị eme ka ebe ahụ na-apịtọ apịtọ ma na-erukwa unyi, ọkachasị n’oge udummiri, n’ihi na oge ọbụla mmiri zoro, idemmiri agaghị ahụ ebe ọ ga-edi wee gafee maọbụ gbadaa n’Ohimiri Naịja, nke na-emezị ya ka ọ na-adọrọ adọrọ maọbụ na-ehuje n’ebe ekwesighị ekwesi, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ na-ebute oke ijummiri na mpaghara ebe ahụ.

  Ọ kọwakwazịrị na ịkutusi ụlọ ndị ahụ ga-enye aka nke ukwuu n’ime ka ọrụ nnwògharị ahụ Gọvanọ Soludo chọrọ ịrụ n’obodo ahụ nwee isi ma gakwa siriri-werere, dịka o siri dị n’atụmatụ nnwogharị ahụ e ji n’aka maka ebe ahụ.

  Na ntụnye nke ya, onye ji ọkwa ‘Chief Surveyor’ n’ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’, bụ Maazị Somto Atuenyi mèrè ka a mara na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mbà n’ịrụ ọrụ ya, ma kwupụtazie ezi njikere ụlọọrụ ahụ dị ịrụ ya bụ ọrụ n’usoro kacha mma. Ọ gwakwazịrị ndị bi na mpaghara ebe ahụ ka ha nye aka mee ka ọrụ ahụ dịrị gọọmenti mfe, ọkachasị site n’ime ihe a gwara ha mee, maka na nke ahụ bụkwa maka ọdịmma ha, obodo ahụ na steeti Anambra n’izugbe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here