Anyị na-agawanye n’ihu na COOUTH – Akabuike

0
8
Dọkịta Akabuike, oge ọ na-edugharị ndị ntaakụkọ n'ime ụlọọgwụ ahụ na-egosi ha akụrụngwa ọgbaraọhụrụ dịgasị n'ebe ahụ

ONYEISI ụlọ ahụike mahadum steeti Anambra bụ ‘Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital (COOUTH)’ dị n’Amakụ, Awka, bụ Dọkịta Josephat Akabuike emeela ka a mara na ya bụ ụlọọgwụ na-agawanye n’ihu n’ịrụ ọrụ dị icheiche e jiri guzobe ya.

  Dọkịta Akabuike kwupụtara nke a n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n’Awka na nsonso a banyere etu ọrụ ya si aga nà etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ kemgbe otu ahọ gara aga kpọnkwem o jiri banye n’ọkwa dịka onyeisi, bụ onye ji ọkwa ‘Chief Medical Director’ nke ụlọọgwụ ahụ.

  Dịka ọ na-edugharị ndị akụkọ n’ime ụlọọgwụ ahụ, ọ nọkwara ebe ahụ kpọkuo ndị Anambra na ndị bi na steeti ahụ ka ha bịa soro na-erite uru n’ọmarịcha akụrụngwa nlekọta ahụike dị icheiche dịgasị n’ụlọ ahụike ahụ oge ọbụla ha nwere nsogbu ahụike, n’ihi na ụlọọgwụ ahụ wàtàrà ọgọdọ ma nwekwa a chọrọ nà akụrụngwa dị icheiche iji lekọta ahụike ụmụafọ steeti ahụ.

  O mere ka a mara na e nweela ọtụtụ mnwògharị na ngalaba niile nke ụlọọgwụ ahụ, ma kpọpụtasịkwa ụfọdụ n’ime mnwogharị ahụ, nke gụnyere ịrụcha na ịgbape ogige maka nne na nwa, bụ ‘Mother and Child Referral Centre’, inwetegharị nkwàdo maka ọzụzụ a na-enye na ngalaba ihe gbasaara ahụike ụmụaka, ịrụ ebe obibi maka ndị ọrụ ahụike a na-akpọtụrụ maka ọnọdụ pụrụ iche, iji hụ na ha na-anọ na gburugburu ụlọ ahụike ahụ oge niile, bụ nke mbụ na mbụ ya e nwegoro na mpaghara ndịda-ọwụwa anyaanwụ ala Nigeria.

  Ihe ndị ọzọ ọ kpọpụtasịrị gụnyere ịrụcha na ịkwajube akụrụngwa ọgbaraọhụrụ n’ogige, ngalaba, na ụlọọrụ dị icheiche dị n’ime ụlọ ahụike ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  O kwezịrị nkwa na ya bụ mnwògharị ga na-aga n’ihu, ọkachasị dịka o sikwara metụta ndị ọrụ ya, site n’ịdị na-enyegharị ha ọzụzụ na mgbe na mgbe nà site n’ịgbà ha ume, iji wee rụọ ọrụ nke ọma na etu o kwesiri.

  N’okwu nke ya, onyeisi otu ‘National Association Of Resident Doctors (NARD)’ n’ụlọ ahụike ahụ, bụ Dọkịta Emmanuel Chukwuka gbara akaebe banyere etu ya bụ ụlọọgwụ si agawanye n’ihu n’okpuru nlekọta Dọkịta Akabuike, tòó ya bụ onyeisi, ma gbakwa akaebe banyere ezi ihe dị icheiche megoro n’ụlọọgwụ ahụ kemgbe ọ banyere n’ọkwa, ọkachasị dịka o siri metụta ịkwàlite ọdịmma ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ nà ọnọdụ ahụike ndị ọrịa.

  Ọ gbakwazịrị ya ume ka o jisie ike n’ọrụ ma ghara ịda mba maọbụ kwee ka ihe ọbụla kpasaa ya anya maọbụ jụọ ya obi oyi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here