Bishọp Ezeokafor enyela igwe mmadụ nkwado site n’otu JDPC

0
10

OTU ịhụnanya a kpọrọ Justice, Development and Peace Caritas (JDPC) enyela ndị onweghị ka ọ ha dị iri atọ na ise n’ọnụọgụ nkwado. E nyere mmadụ iri na otu onyinye igwe e ji akwa akwa (sewing matchine), ma nye ndị ọzọ onyinye ego karịrị nde naịra abụọ.

  Ọ bụ n’obi Chukwu, St Patrick’s Cathedral, Awka, ka a nọrọ mee emume ahụ. Bishọp ụka katọlik dayọsis nke Awka, Most Rev Paulinus Ezeokafor toro ndị JDPC maka ezi mbọ ha na agba, dịka ọ gwara ndị ahụ ritere onyinye amara ndị ahụ na ọ bụ n’ihi ọrụ ọma ha ka ihe ndị ahụ jiri were ru ha aka.

 N’okwu nke ya mgbe a na-ahafe ihe ndị ahụ n’aka ndị mmadụ sitere parish dị iche iche, Chanselọ dayọsis Awka bụ Fada Charles Ndubisi kpọkuru ha ka ha leruo anya ala ma were ihe ndị ahụ kpọrọ ihe.

 Daịrektọ Levi Uko kelere Bishọp tinyere ndị ọzọ; ma kpọkuo parish niile ka ha hibe otu JDPC na parish ha dị iche iche.

  N’akụkụ nke ya, otu onye n’ime ndị ritere onyinye ndị ahụ, Rita Nwabueze si Ebenebe kelere Bishọp Ezeokafor ma dụkwaa ndị niile e nyere ha na ya nkwado ahụ ọdụ ka ha jiri ihe ndị ahụ e nyere ha rụpụta ihe. Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ndị parish enwebeghị JDPC gba mbọ hibe ya na parish ha.

GUO:  Ụka ga-enyenwuru ndị ụka aka nweta ọrụ, nkwado – Nnabuife

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here