Gọọmenti etiti emeela Fraịdee na Mọnde ụbọchị ezumike maka Isịta

0
9

GỌỌMENTI Etiti ekwuputala na  Fraịdee 15 na Mọnde 18 Epure, 2022 ga-abụ ụbọchị ezumike maka ọha na eze.

 Ụbọchị Fraịdee ga-abụ Ezigbo Fraịdee (Good Friday) dịka otu ụzọ emume e ji akwado Ista, Ista Mụnde bụ iji metọpụ emume Ista.

 Minista na-ahụ maka ime (Minister of Interior), Ogbeni Rauf Aregbesola, onye kwuputara nke ahụ n’aha Gọọmenti Etiti kpọkuru ndị otu Kristi ka ha ṅomie usoro ịchụaja, ịdịnootu, mgbaghara, obiọma,  ịhụnanya, udo na ndidi, bụ nke e jiri mara Jesu Kristi; ma bụrụkwa ihe ndị o gosipụtara na mgbasaozi ya n’ụwa.

 Aregbesola, n’ozi nke sitere n’aka Odeakwụkwọ Ọkpụtọrọkpụ ministrị ahụ, Dọkịnta Shuaib kpọkukwara ndị otu Kristi, tinyere ndị Nigeria niile ka ha jiri emume Ista nke afọ a wee kpee ekpere maka nkwụsị ọnọdụ enweghị ezi nchekwa niile cheere ala anyị gbaa gburugburu aka mgba.

 O kwere nkwa na Gọọmenti Etiti ga-eforo ntutu taa iji hụ na e wetara na njedebe, mwakpo ndị omekome na-eme n’ụzọ awaraawara, ọdụụgbọelu na ụzọ ụgbọoloko n’ala anyị.

 Dịka ọ na-agọrọ ndị otu Kristi, ma ọ nọ n’ụlọ ma ọ nọ n’ụzọ ije ọfọ Ista ọma, Aregbesola kpọkukwara ndị Nigeria ka ha tinyere ọchịchị Onyeisiala Muhamladu Buhari aka na mbọ ọ na-agba ka ala anyị wee dị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here