Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua (2)

0
9

MAAZI Uzoegwu kwuru sị: Adị m afọ ise mgbe nna m nwụrụ. Nne m mụrụ anyị asatọ. Ozugbo nna m nwụchara, nwanne ya nwaanyị a na-alụ n’obodo ọzọ kpọọrọ m laa be ya.

 Amalitere m mgbe ahụ biri n’ụlọ ya ka nwa ya. Ọ malitekwara nyebe m ọzụzụ dịka nwa ọ mụrụ n’afọ ya. N’ihi na ụmụ ya etoola ma chọrọ akaraka ha pụọ, anọdụziri m dịka obere nwa ya. Nwanne nna m ahụ mere m nke ọma. Ana m eje ozi ụlọ niile m kwesịrị ije. Amalitere m gụwa akwụkwọ prịma, ma mechaa baa sekọndịrị. Mgbe m gụchara, nwa ya nwoke bi obodo mepere emepe bịara kpọrọ m. Mgbe m ruru ebe ahụ, amalitere m gbabara ya odibọ ahịa nke a na-akpọ ịgba bọyị n’ala Igbo. Agbara m odibo afọ isii tupu eduo m obi, m were malite ahịa nke m.

  Ọzụzụ nwanne nna m na nwa ya nwoke nyere m mere ka m bụrụ mmadụ taa. Ọ bụrụ na a hapụrụ m n’aka nne m mgbe nna nwụchara ka sọọsọ ya zụọ m, eleghị anya agaghị m abụ ihe m bụ taa. N’ihi nke a ka m ji ekwusi ike na otu onye anaghị azụ nwa. O kwesịrị ka e nye ikwu na ibe ohere ka ha nye aka n’ịzụ ụmụaka.

  Ọzọ dị ka ibe ya bụ na ọ bụrụ na mụ enweghị nrube isi, ọgaghị adabara m. Ya mere, ana m adụ ụmụaka ugbua ndụmọdụ ka ha na-erube isi, ka o wee dịrị ha na mma.

  N’akụkụ nke ya, Maazi Chiedu kwuru sị: Nne na nna m bi Onitsha ebe ha ji ego achụ nta ego. Mgbe m ka dị obere ka m malitere mebe nnukwu isi ike, nke na anaghị m anụ ihe mmadụ na-ekwu. Ịgwa m okwu mgbe ahụ na-adị ka ịwụsa mmiri n’okwute. Mgbe nne na nna m hụrụ na mmiri na-achọ ịṅa garị n’ebe m nọ, ha kpọgaara m nwanne nne m ya na di ya na-akụzi nkụzi n’ime obodo.

GUO:  Ịzụ ụmụaka: Oge gboo, oge ugbua

  Mgbe m ruru obodo ahụ, ajụrụ m na mụ agaghị anọ, ma ha gwọrụ m ịba ma mee ka o doo m anya na ọ bụ iwu na m ga-ebirịrị ebe ahụ. Site ụbọchị ahụ, anaghị m enwekwa ohere ịpụ n’ụlọakwụkwọ, gwuru egwu na-agagharị n’ọhịa na ụzụ. Otu ụbọchị m mere ya, ha mere m ihe yiri ihe a na-eme onye ohi, nke mere ka m gara adụ nyara n’olu.

  Otu ahụ ka ha siri hazie m, m baara onwe m uru, ma bụrụ onye e ji okwu ya agba izu taa. Ya ka m ji ekwusi ike na otu onye anaghị azụ nwa. Ejighị otu aka azụ nwa, onye mee okweghị ya, o nye onye ọzọ ohere ka o mee ike ya.

  Oriakụ Adaora kwuru sị: Abụ m ihe m bụ taa n’ihi na a kpọpụrụ m n’ụlọ anyị ma kpọga m be ndị anyị amaghị ndị ha bụ, ka m kuoro ha nwa. Ezinaụlọ ahụ zuru ka e mee. Ha bụ ndị ọrụoyibo ma biri Awka, isi obodo steeti Anambra.

  N’agbanyeghị na ha amaghị onye m bụ n’ihi na e sitere n’aka fere aka wee kpọta m ebe ahụ, maka na nne na nna m dara ogbenye ọnụ ntụ, anyị ahụghị tụtụrụ rachaa; ma ha nabatara m n’obi ọcha. Ha enyeghị m mmegbu ọbụla.

  Ka m na-ekuru ha nwa, ka m na-agụkwa akwụkwọ. Anọ m ebe ahụ kuo ụmụ anọ.

  Nke tụkarịchara m n’anya bụ na mgbe m gụchara sekọndịrị, ha zigara m mahadum, ebe m nọ turu ugo mmụta nke mụ atụghị anya ya n’ụwa a. Taa, otu enyi ha nwoke na-akụzi na mahadum ahụ bụ di m.

  E nweghị ndidi so n’ihe na-egbu ụmụaka ugbu a. Ụfọdụ na-achọ ihe ụwa n’elu n’elu, ma ọdịghị otu ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here