Na Kogi, ehi iri abụọ anwụọla ka ha tachara ahịhịa

0
8

Ọ BỤ ihe mgbagwoju anya ka ehi dị iri abụọ n’ọnụọgụ si nwụọ pịị na ntụmadị, ozugbo ha tachara ahịhịa na Lokoja,  steeti Kogi.

 O nweghị onye nwere ike ịkọwa ihe mere ehi ndị ahụ jiri nwụ, ma ndị  mmadụ na-ekwu na ọ bụ nsi (poison) ka e nyere ha.

  Ya mere, n’ihi ya bụ ihe nke mere n’izuụka gara aga, gọọmenti steeti Kogi dọrọ ndị nke ya aka na ntị ka ha zeere ịta anụ ehi  otu izuụka.

 Onyeisi, Veterinary Services steeti ahụ, Dọkịnta Salau Tarawa oge ọ na-enye ndụmọdụ ahụ n’izuụka gara aga kwuru na ka ha nwetachara mkpesa ahụ, na ndị ọrụ ha zọpụrụ njem ozigbo ma bukọrọ ụfọdụ anụ ehi ndị ahụ e nwetara n’ahịa. Ọ rụtụrụ aka ma sị na e kwuru na e burula ehi ndị ọzọ gaa Osara, Ajaokuta, Obajana, Kotonkarfe  na Kakanda, ka e resi ha ọha na eze amaghị ihe merenụ.

 Otu o sila dị, ọ gara n’ihu kọwaa na ministịrị na-ahụ maka ọrụugbo na ndị ọrụ nchekwa akpọọla ndị na-achị ehi (herders) okwu ahụ gbasara oku maka ịgba ha ajụjụ, tinyere ụzọ a ga-esi kwọ onye ukwu wara.

 N’akụkụ nke ya, Odeakwụkwọ Ọkpụtọrọkpụ ngalaba ọrụugbo, Mallam Abdulganiyu rịọrọ ọha na eze ka ha gee ministrị ahụ ntị ma kwenye n’ihe ha na-ekwu.

 Onyeisi Agro Rangers Unit Kogi State Command, Nigeria Security and Civil Defence Corps, Bayode Emmanuel kọwara na ọ bụ ufọdụ ndị ọrụ hụrụ ehi ndị ahụ ka ha si n’azụ obi gọọmenti na-apụta. N’otu ntabi anya, na ha malitere kpaba agwa edochaghị anya, daa ma nwụchaa.

GUO:  Na Kogi, ndị nta ejidela ndị omekoome anọ

Otu o sila dị, Odeakwụkwọ mgbasaozi NSCDC nke steeti ahụ, Alex Agiri kwuru na Kọmandant bụ Suleman Mafara enyela ntụziaka maka ime nnyocha ma chọpụta ebe ha tara ahịhịa ma kwụsịkwa ire na ịta anụ ndị ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here