Na Yobe, e gwuputala ego igwe pụtara nde naịra iri n’ala

0
8

…Nke e liri ihe dịka afọ iri asaa gara aga

OKE ọṅụ dara na Badejo nke dị n’okpuru ọchịchị Potiskum na steeti Yobe, site na nchọpụta a chọpụtra ego igwe (coins) nke e kwenyere na e liri n’ugbo afọ iri asaa na ise gara aga.

 Onye chọpụtara ego igwe ahụ nke nnyocha kwuru na ọnụ ego ya dị nde naịra iri (N10m) bụ Ibrahim Badejo na ndị otu ya.

 Ibrahim Badajo bụ otu n’ime ụmụ ụmụ ụmụ (great grand sons) onye nwe igbo ahụ ma bụrụkwa onye chọpụtara obodo ahụ, Mai Shuwa Badejo.

 Badejo bụ onye nwe ugbo, Kakasku Blan Integrated Farm and Hatchery nke dị na Badejo.

 Ọ na-agụ akwụkwọ inweta nzere ‘master’s degree’ n’ihe ọmụmụ Biochemistry na Molecular Biology na mahadum Jiangnan University, Wuxi, Jiangsu dị na mba China; oge nsogbu korona kpọtụrụ n’ụwa, n’afọ 2020.

 Badejo nọ Nigeria oge korona malitere, ya mere ọ ndụziri n’ala nna ya dịka e hibere iwu ụzọ aga aga (lockdown).

 O kwuru sị:”Kemgbe m si China bata n’ihi korona, e nweghị ọrụ dịnụ. Ọrụ ịzụ ọkụkọ bụ ihe doro m anya n’ụmụaka, ya mere a gwara m nna m na achọrọ m imepe ugbo ebe a na-azụ ọkụkọ, iji na-emepụta nri ọkụkọ, akwa tinyere ịhụ maka ahụike ụmụ anụmanụ (vetinary services).”

  Otu o sila dị, o kwuru na nna ya nyere nkwado ya ma ihe ọgbata uhie o nwere iji mejuputa ebumnuche ya bụ ego. Ma nke ahụ emeghị ka ọ daa mba dịka ọ gara n’ihu ree ụfọdụ ihe o nwere ma hibe ugbo ahụ, debanye aha n’aka ndị ọ dị n’aka wee nwete ikike zuru oke. Otu ahụ ka o siri malite ọrụ n’ike n’ike, nke gụnyere ịzụ ọkụkọ, imepụta nri ọkụkọ, ntụ fetilaịza, akwa, na akwụkwọnri.

 Ọ gara n’ihu kọwaa na nna ya nyere ya ala nke o ritere n’aka nna ya; bụkwa nke nna ya ritekwara n’aka nna nke ya.

  Ka ihe siri gbata kwụrụ, o nweghịkwa ike irụ ihe na-aga n’ihu dịka ọ chọrọ n’ihe na ofe dị ụtọ bụ ego ka e ji esi ya. N’ihi ya, o tinyere akwụkwọ iji nweta nkwado n’aka ndị ọ dị n’aka, na-akwado udị ọrụ ahụ. Ọ dịrịghị ya mfe, mana n’ikpeazụ, o nwetara nkwado, n’ụzọ ahụ o nwetara ụfọdụ akọrọngwa ọgbara ọhụrụ e ji arụ ọrụ.

 Ya mere, ọ bụ ka ya na ndị ọrụ ya nọ n’ọrụ iji wuo ugbo ahụ ka ha chọpụtara ite e ji ụrọ kpụọ, ego juputara n’ime ya, nke e liri n’ala. Dịka o siri kwu, mgbe e gwuputere ya e chere na ọ bụ ọgwụ, ma ka e tiwara ya, ihe a hụrụ bụ ego igwe juputara n’ime ya, n’ụdị dị iche iche.

 Badejo kwuru na onweghị onye o doro anya ebe e zoro ego ahụ, na ọ bụ mgbe ya bụ ihe mechara ka nna ya kọọrọ ya ihe banyere ya, yaabụ mgbe a chọpụtachara ya.

 O kwuru sị:” Nna m gwara m na nne ya gwara ya na onye nwe ala ahụ, bụ nna nna nna m, zoro ego n’ime ala ma ha amaghị ebe ọ bụ kpọmkwem. Amaghị m banyere akụkọ a ganye na a chọta ya. E nwere nkwenye na ọ bụ Mai Shuwa Badejo, onye chọpụtara obodo Badejo, liri ya. Ọ bụ onye nwere ego a maara nke ọma,  nwee ọtụtụ ehi ma tinyekwa aka n’ịkọ ugbo. Otu o sila dị, Badejo kọwara na odogwu nwoke ahụ nwetara oke mkpagbu site n’aka ndị ọchịchị ọdịnala oge ahụ.

 O kwuru na ego igwe ndị ahụ e gwuputara n’ala bụ ego mba Britain, e mebere ha na United Kingdom ma kesakwaa ha na mba West Africa dịka Nigeria. E nwere nke 1930 ga, wee dịrị gawa.

 Ka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a, Badajo kwuru sị:

“Anyị chọrọ iresị (auction) ego igwe ndị ahụ n’ebe ihe ndebe ọkpụ  maọbụ mmadụ ọbụla nwere mmasị na ha; ma n’ala Nigeria ma gafee”.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here