Ndị ụka Krịstị amalitela emume Izuụka dị Asọ

0
10

NDỊ ụka Kraịst n’ụwa niile abaala izuụka dị asọ, nke bụ oge ha ji eme emume dị iche iche, iji kwado Ista.

 Ọ bụ emume Ụka Igu (Palm Sunday), nke e mere ụbọchị ụka ka e ji amalite ya. Ọ na-ebido ụbọchị ahụ wee ruo  n’Îsta kpọmkwem. Ụbọchị ụka igu bụ ncheta mbanye Dinwenụ Jesu Kristi banyere Jerusalem, maka ahụhụ na ọnwụ ya iji gbapụta ndị nke ya na njọ.

 Taa bụ Tọzdee, a ga-anọ n’ụlọụka dị iche iche mmee emume. Ndị ọbụla na-eme dịka usoro ụka ha siri dị.

 N’ụka katọlik, ha ga-eme emume nke ha ụtụtụ na mgbede. Ha ga-eji ụtụtụ gaa Chrism Mass, nke Bishọp na-anọ na ya gọzie mmanụ nsọ ụka ji arụ ọrụ dị iche iche. A bịa na mgbede, ha e mee emume icheta nri abalị ikpeazụ Jesu Kristi na ụmụazụ ya riri, bụ nke ọ nọrọ na ya wee hibe Oriri dị Asọ. Ụkọchukwu ga-anọkwa na ya saa ndị mmadụ ụkwụ iji cheta ka Jesu siri sa ụmụazụ ya ụkwụ oge ọ nọ n’ụwa. N’ikpeazụ, ha ga-eche nche ọ bụladị otu awa, dịka o siri gwa ụmụazụ ya ka ha mee.

 Echi bụ Ezigbo Fraịdee (Good Fraịdee), bụ ụbọchị ekpere na ebumọnụ n’ụzọ pụrụ iche. Ụfọdụ ụka na-asọ nsọ anụ, na ihe ndị ọzọ na-amasị mmadụ dịka mmanya; tinyere ngagharị nke obe, bụ nke a na-eso n’usoro etu Jesu siri ta ahụhụ site na mgbe Pilate mara ya ikpeọnwụ ganye na ọ nwụọ, a dọnye ahụ ya n’ime ili.Ọ bụ na Fraịdee ahụ ka e ji echeta kpọmkwem ụbọchị Onyenweanyị nwụrụ n’elu obe.

  Na mgbede/abalị Satọdee ka a ga-aka ụka nche abalị Ista. Ụbụchị ụka bụzi ụbọchị Ista (Easter Sunday), a kaa ụka Ista; oriri na ọṅụṅụ amalite.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here