Echiche ndị mmadụ banyere ihe nwaanyị kwesịrị ime ma di ya malite ịkpagbu ya

0
4

NWOKE ịkpagbu nwaanyị (nwunye ya) bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’oge ugba a. Ọtụtụ ụmụnwaanyị atụfuola ndụ ha ebe ụfọdụ nwetara oke mmerụ ahụ banyere ya. Ụfọdụ ụmụnwoke gara be mmadụ lụrụ nwaanyị dịka okike kere ụwa siri debe ya, ma n’ikpeazụ, ha atụgharịa were nwaanyị ahụ mere ihe ha ji akụ ọkpọ.

  Ha na-eyi ụmụnwaanyi egwu nke na ụfọdụ n’ime ha anaghi ahụ ọnụ ha ji agwa ikwunaibe ha ihe ha na-agabiga na be di ha. Ndị nke kwuputara ọnọdụ ha, na-anọgidekwa na mkpagbu n’ihi na e kpechaara ha udo, a gwa ha ka ha sorokwa di ha laghachi azụ na be ya. Isiokwu wee bụrụ na e mechaa ihe na-ebenụ, a na-eberịrị.

   Na nwa mgbe gara aga ka a nụrụ akụkọ banyere ọnwụ otu nwaanyi na-agụ egwu aha ya bụ Osinachi Nwachukwu, onye e kwuru na ọ lara mmụọ n’ihi mmerụ ahụ o nwetara ka di ya na-eti ya ihe. Nwaanyị ahụ nke a maara nke ọma n’ala anyị n’ihi egwu ụka ọ na-agụ ka a na-ekwu na ọ gabigara ọtụtụ mmegide n’aka di ya bụ Peter Nwachukwu.

Ọ bụ ka ọ nwụchara ka ụmụnne ya, ụmụ ya na ndị maara ya nke ọma malitere nyebe mkpesa banyere ihe ọjọọ di iche iche di ya na-eme ya. Gịnị mere na ndị ahụ na-eweta mkpesa ugbu a emeghị ya mgbe Osinachi dị ndụ? Ugbu a, ọ laala mmụọ, ihe niile a na-ekwuzi bụ okwu na-eso akụkọ. O kwesịrị ka a kwọọ mmiri mgbe ọ dị n’ọgbugba ọla. E mere elu, e mere ala, onye nwụrụ anwụ a nwụọla.

Nke ọzọ dị ka ibe ya bụ na otu nwaanyị dị ya na-eti ihe tinka tiri paanụ bịara n’ụlọ  nna ya nye mkpesa na  ọ agaghị alaghachi azụ. Mgbe o kwuchara, nne na nna ya nyere ya ndumọdụ ma rịọ ya ka ọ laghachi azụ n’ụlọ dị ya, ma ọ jụrụ ajụ. Ha mechara kpọọ ikpe, n’ikpeazụ a manyere ya ka o soro di ya laa mgbe ọ jụrụ ma jụsie ike iso ya . N’ihi nke ahụ, nwaanyị ahụ laghachiri azụ na be di ya. Ka ọ gachara ọnwa olemole, di ya ji aka tigbuo ya, ọ nwụọ. Nne na nna ya malite mkpesa. Ha kwara arịrị ọnwụ nwa ha nwaanyị n’uzo dị egwu n’ihi na ha jụrụ ige ntị n’ihe ọ gwara ha.

   Otu o sila dị, ọtụtụ mmadu na-akatọ ọnọdụ nwoke ịkpagbu nwunye ya. Ha na-ekwu na ọ bụ arụrụala jọgburu onwe ya.

  Maazi Okoronkwo kwuru sị: Ana m ajụ, ọbụkwa nwaanyị nke a m so alụ? Kedụ ka nwaanyị ga-esi na-agabiga ntarmahụhụ n’aka di ya ma gbachikwa nkịtị, ọ gaghi ekwu? Lee akụkọ jọgburu onwe ya a kọrọ n’oge gara aga ma bụrụkwa nke a ka na’akọ ugbu a. Ana m ekwu banyere Osinachi Nwachukwu. Kedụ ka mmadụ dị otu ahụ ga-esi nwụọ ụdị ọnwụ ahụ ọ nwụrụ? Onye gbasiri ike na emepụta ihe a hụrụ anya. Kedụ ka o siri nye nwoke ọ kpọrọ di ya ohere, o gbuo ya? N’ikwu ezi okwu, akụkọ ahụ adịghị mma ọkụkọ. Olee ihe mere na ndị ahụ niile na-eme mkpesaahụ n’ile na-eme mkpesa ka ọ nwụchara emeghị ka a mata ọnọdụ ọ nọ na be di ya oge ọ dị ndụ? Iji kọọ n’ubi onye anyị bịara, nwaanyị obụla di ya na-eyi oke egwu kwesịrị  ịkwakọrọ ngwongwo ya niile, tinyere ụmụ ya, si na be di ya pụọ na ndụ. Onweghị ihe nwaanyị nọ be  nwoke na-akpagbu ya eme.

  A na-gbara ekwensu ọsọ. Ọ bụrụ na ndị be nwaanyị ahụ ekweghi ka ọ lọta na be nna ya, biko ya chọọ ebe ọ ga-agbala. Ya meghepụ ọnụ kọọrọ ụwa otu o siri dịrị ya, ọ ga-enweta enyemaka. Ya gaa n’ihu kpọkuo Chineke, ọ ga-azọputa ya. Ọtụtụ ndị ụka sị na mmadụ ekwesịghị ịhapụ di ma ọ bụ nwunye ya , ma a na m asị na nke ahụ bụ asị. N’ọnọdụ  na mmadụ na-agba ọsọ ndụ ya, ọ dịghị njọ n’ihi na ihe onye ahụ na-eme bụ ịga biri otu ebe, ọ bughị ịgba ashawo.

  Oriakụ Okeke: Biko nwaanyị ọbụla di ya na-akpagbu kwara ngwongwo ya gbalaga. Ada m nwaanyị kaara ịbu onye nwụrụ anwụ taa ma ọ bụrụ na mụ na nna ya asịghị ya lọta ozịgbo, site na be di ya. Ya na di ya bi na Lagos, mgbe ọ mụrụ nwa nke abụọ ka nsogbu malitere. Nne di ya si ime obodo gaa Lagos binyere ha ma kwuo na o nwere mmụọ ọjọọ na-esogbu nwa m. Ka a na-ekwu nke ahụ, ha napụrụ ya nwa o ku na-aka ma gwa ya ka ọ ghara imetụ ya aka ọzọ. Tupu ị mata ihe na-emenụ, di ya malitere kpagbube ya, nke na anyi ji ọsọ gaa kpọrọ ya. Ihe a mere ọtụtụ afọ gara aga, anyi na ya tinyere ụmụ ya bi taa. Ọ kaara m mma na nwa m dị ndụ, mụ na ya biri, karịa na ọ nọ be di ya nwụọ n’ike. Ya mere, ana m adụ nwaanyi obula di ya na-akpagbu ka o nye ohere n’ụlọ ahụ. Ọ bụghị ihe niile ka a na-eji ndidi eso. Ihapụ nwoke site n’ịnọ n’ụlọ ya na-agabiga nsogbu, marakwa na otu ubọchị ị ga-eji ndịdị ahụ baa ala ili mgbe ịtụghị anya. Anya saa, maka na nkwụcha abụghị ụjọ.

  Oriakụ Ezenwanne: Ihe gbasara nwoke iti nwuye ya ihe bụ akụkọ ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eso ya n’ike, ma ọ bughị ọnọdụ a na-eso n’ike. Ọ bughị ihe a na-alụta n’ọgụ, nke a na-abata ya na mba. E kpee udo ole a ga-ekpe, ihe ọzọ na-eso ya bụ nwaanyị isi be di ya pụọ, ka udo chịa. Mgbe ụfọdụ, nwoke na nwaanyị na-ebi n’ụlọ n’ebughị ụzọ chọpụta ma ha abụọ o kwesịkwara ibikọta ọnụ. Ọtụtụ di na nwunye a na-alụ n’ụwa taa bụ ebe nwoke na nwaanị zụkọrịtara, ha amalite alumdinanwunye. Ụfọdụ ka agwa ha na-akpa anaghị adakọrịta. N’ọnọdụ di otu ahụ, a ga na-enwe nsogbu. Ọ bụladi n’oge gboo, ọ na-eme. Ọgụ di na nwunye amaliteghi taa.

  N’oge ahụ, otu nwaanyị ka e kwuru na di ya na-eti ya ihe oge niile. Ya mere, ka o tichara ya otu ụbọchị,  nwaanyị beere akwa ga-kpesara nwanne ya nwoke onye ji iwe gaa ọgu na be di nwanne ya. ka o ruru ebe ahụ, ya na ọgọ ya nwoke (di nwanne ya nwaanyị ahụ) malitere lụba ọgụ. Tupu ị mara ihe na-eme, di nwanne ya sụrụ ya mma n’obi, ọ daa, nwụọ. Nwaanyị ahụ sitere n’ọnọdụ ahụ tụfuo ndụ nwanne ya nwoke ma tinyekwara ndu di ya; maka na ndị uweojii bịara kpụrụ di ya pụọ, ahụghikwa ya anya ọzọ ruo taa.

 Mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ kwaara ngwongwo ya gbalaa be nna ya biri, onweghị onye gaara anwụ. Ya mere, ndụmọdụ m na-enye  bụ onye ọbụla mara ihe. Mgbe ị hụrụ na onye ị kpọrọ   di gị agba-nweela n’ebe ị nọ site n’iji gị mere ihe e ji eti ọkpọ, si n’ulo ahụ nyere ya efe. Ọ ka mma na ị di ndụ nọọrọ onwe gị, karịa ịhapụ di gi ka o jiri aka tigbuo gị.

  Oriakụ Iwuala: Mgbe m gbachara akwụkwọ, mụ na di m biri afọ anọ amụtaghị m nwa. Ọ malitere kpagbube m, ma na-eti m ihe oge niile. Ọbụlado mgbe m malitere tụba ime, ọ gara n’ihu na-emesi m ike nke ziputara na ọbụghị maka amụtaghị nwa ka o ji  tibe m ihe.  O tiri m ihe dị egwu nke mere ka m were ajụ ọnwụ kụọ ya okpiri n’anya. Ọ fodụrụ obere ka anya ya kpọọ. Ka ya bụ ihe mechara, ozugbu ahụ ka m kwakọọrọ ihe m gbalaa be nna m.

  Be nna m ka m nọ wee zụchaa ụmụ abụọ m mụtara. Ọ bụzi mgbe nwa m wnoke tolitere, rụọ ụlọ ma lụkwaa nwaanyị ka m laghachiri be di m. Mgbe ahụ, di m emeela okenye. Biko, ana m akpọku ụmụnwaanyị ibe m ka ha were ehihie chụọ ewu ojii. Ka ọ hapu ịbu oge ọbụla a na-anụ na nwoke tigburu nwunye ya. I buo ibu alumdi o kweghi gị, I sepụ isi maka na onye nwụrụ anwụ, anwuchaala. Ihe na-ewutekarịcha m n’ọnọdụ a bụ na ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị bụ ezigbo mmadụ ka ụmụnwoke na-anyụ ịkpakwụ.

A na-emegbu ha, ha agaghị ekwu, otu  ahụ ka ha ga na-eme nwayọọ nwayọọ, ha anaghi enwe ọnụ okwu wee ruo mgbe nwoke chụkpuru ha n’ime ili n’oge erughị eru. Mbanụ, anaghị akọ ụdị akụkọ ahụ akọ maka na okeke nwaanyị dị njọ. Onye ọbụla di ndụ kwesiri inwe nkwuwa okwu. Kwupụta ihe ọnbula ahụ gị anabataghị. Nwaanyị ịgbachi nkịti hapụ di ya ka o gbuo ya bụ mmadụ ịkpachara anya memilaa onwe ya. Gbaa ọsọ ndụ gị site n’ịhapu nwoke ahụ. Nye ya ohere ka isi kpakọọ ya ọnụ; ka i zukwuo ike.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here