Soludo eduola mmadụ anọ ọzọ n’iyi ọrụ

0
4
Ndị ndụmọdụ pụrụiche ahụ e duru n'iyi ọrụ (bido n’aka ekpe), Nweke, Omenugha na Udokwu

GỌVANỌ steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Mọnde wee duo mmadụ atọ ọzọ n’iyi ọrụ iji ọkwa dị icheiche n’ọchịchị ya na steeti.

  Mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu ‘International Convention Centre’ dị n’Awka, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ wee duo otu onye n’iyi ọrụ dịka Kọmishọna, dukwa mmadụ atọ ndị ọzọ n’iyi ọrụ dịka ndị ndụmọdụ pụrụiche na ngalaba dị icheiche.

  Ndị ahụ o duru n’iyi ọrụ ọhụrụ gụnyèrè Ọkaiwu Sly Ezeokenwa, bụ onye o duru dịka Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ pụrụiche na steeti ahụ; Dọkịta Nelson Omenugha (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n’ihe gbasaara nkwàlite ndị ntorobịa); Maazị Bob-Manuel Udokwu (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n’ihe gbasaara ime obi añụrị, mmesapụahụ na njem nlegharịanya); na Ọkaiwu Tobechukwu Nweke (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụiche nye Gọvanọ n’ihe gbasara iwu).

  Ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu oge ọ na-edu ha n’iyi ọrụ ahụ, Gọvanọ Soludo gbàrà hà ume ka ha gbasie mbọ ike n’arụmọrụ ha n’ihi na a họpụtara ha n’ihi na ha gosipụtara na ha tozuru okè ma bụrụkwa ndị nwere àgwà pụrụ iche iji rụọ ọrụ ahụ dị icheiche a kpọlitere ha ka ha rụọ.

  Ọ chètààrà ha na mkpọlite ahụ a kpọlitere ha n’ọkwa dị icheiche bụ òkù ọrụ ka a kpọrọ ha iji wulite steeti na ọganihu ya n’ogoogo dị elu.

  Ọ gwara ha ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nye aka mee ka atumatu dị icheiche ọchịchị ya ji n’aka bịa na mmezù nke ọma.

GUO:  N'Anambra, ndị ụka ekpeela ekpere maka ezi nchekwa, gọzie ọchịchị Soludo

  N’okwu ha n’ótù n’ótù banyere mkpọlite ahụ a kpọlitere ha na odudu ahụ e duru ha n’iyi ọrụ, mmadụ anọ ahụ kèlèrè Gọvanọ Soludo maka ịhụta ha dịka ndị tozuru oke maka ya bụ mkpọlite.

  Ha kwezịrị nkwà iji ahụmahụ ha na obi ha wee jeere steeti ahụ ozi n’ikwesi ntụkwasịobi, ya na ịrụ ọrụ ahụ a hànyèrè ya n’aka nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

  Ọ dị ncheta na Gọvanọ Soludo nọrọ n’izuụka gara aga wee kpọlite mmadụ asatọ ọhụrụ n’ọkwa dịgasị icheiche.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here