Ụka Nne nke afọ a tọrọ ụtọ pụrụ iche – ụmụaka

0
4

ỤBỌCHỊ ụka ka ndị ụka Katọlik mere ụka nne. Emume a bụ omenafọ nke ndị ụka Kraịst na-eme. 

  Ọ bụ ụbọchị pụrụ iche e ji echeta ndị nne. Ọ na-abụ ụbọchị oke ọṅụ n’ezinụlọ ọbụla. Ụka nne na-amasị ma nwata ma okenye. Ọ na-abụ ohere ọma ndị nne ji egosikarị ndị ezinụlọ ha ịhụnanya. Ha na-esi erimeri dị icheiche, ebe ikwunaibe na-ezukọrịta ma ṅụkwaa. Ndị nne na-anọkwa n’ụbọchị ahụ nweta ihe onyinye dị icheiche dịka akwa, akpụkpụkwụ, ịchafụ isi, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Dịka aha ya siri dị, ihe izizi a na-eme ụbọchị ụka nne bụ ịga n’ụlọụka, kàá ụka ma tụkwaara Chineke mmamma. Ndị nne na-anọ na ya bụọ abụ dị icheiche. N’oge ụka nne, ha na-emekwa ihe ngosị dị icheiche dịka ịgba bọọlụ, ime ejije, ịgba egwu wee dịrị gaba.

  N’ajụjụọnụ a gbara ha, ọtụtụ ụmụaka tinyere ọnụ ma kwuo ka ha siri hụta ụka nne nke afọ a, bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị ụka gara aga.

  Ụfọdụ ndị ahụ kwuru okwu nà ihe ha kwùrù gụnyèrè: Oluebube gbara afọ asatọ kwuru sị:  “Obi dị m ụtọ maka ụka nne e mere taa. Agara m ụka n’ụtụtụ, ka anyị lọtara, nne m nyere anyị osikapa nke o ji anụ ọkụkọ sie. Ofe osikapa nne m siri tọrọ m ụtọ nke ukwuu. Ya mere, ekpere m n’isi nne m bụ ka Chukwu nye ya ogologo ndụ na ahụike.”

  Somtochukwu gbara afọ iri na atọ kwuru sị: “Anyị riri nri rijuo afọ nke ọma, ma ṅụkwaa mmanya. Anyị nọ n’ụlọ ka anyị richara nri kiribe onyoonyoo. Ekpere m n’isi nne m bụ ogologo ndụ na nchedo Chukwu, ebe ọbụla ọ na-aga.”

  Sọpụruchukwu gbara afọ iri sị: “Isi ọṅụ m bụ na Chineke mere ka m dị ndụ wee hụ ụka nne nke afọ a. Nne m bi n’obodo anyị dị na steeti Anambra, ma mụ na ụmụnne m na nna m bi n’Abia, ma dịka anyị bịara ezumike Ista na nke nne m, anyị na ya mere ụka nne nke afọ a. Ekpere m n’isi ya bụ ogologo ndụ na ahụ ike.”

  Ekene gbara afọ iri na abụọ sị̀ “Ụka nne nke afọ a bụ ọkachamma. Mụ na ụmụnne m riri osikapa, taa anụ ma ṅụkwaa mmanya. Anyị gakwara na nke nne anyị ochie, o nyere anyị ụkwa a gwọrọ agwọ na azụ ọkpọọ. Mgbe anyị na-ala, ọ nwụnyere anyị obere ọkụkọ abụọ nke ọ sịrị anyị zụba, ha too, bụọ ụmụ anyị anwụtakwara ya abụọ. Ekpere m n’isi ha bụ ngọzi na amara Chineke.

  Chinemerem gbara afọ iri na asaa sị̀: “Ụka nne nke afọ a dị egwu. Na parish anyị, ndị nne na ndị nna gbara bọọlụ ụbọchị Satọdee, ndị nne wee merie ndị nna. Ha boro ha ọkpụ atọ. Nke a wee bụrụ ihe oke ọṅụ. Kaosiladị, ọ bụ eziokwu na ana m amụ ọrụ ịkwa akwa, ebidobeghị m nke m, ma akabara m ahụ gotere nne m akpụkpụụkwụ site n’ego ndị mmadụ na-enye m.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here