Ụmụnwaanyị nwèrè ọrụ pụrụ iche n’ịkwàlite nchekwa obodo – Achịbishọp Kaigama

0
4

ACHỊBISHỌP ụka Katọlik na dayọsis Abuja, Ignatius Kaigama ekwuola na ụmụnwaanyị ga-atụnye ụtụ n’iwèta ezi nchekwa n’obodo ma ọ bụrụ na e nye ha ohere.


Ọ kpọkụru gọọmenti etiti na nke steeti dị icheiche ka ha kwàdo ma haziere ụmụnwaanyị ụzọ isonye na mbọ a na-agba ka obodo dị mma; ma gwakwa ha gbaa mbọ ka a hụkwa na e wetara n’isi njedebe mkpagbu a na-akpàgbu ha.


Achịbishọp Kaigama kwuputara nke ahụ n’okwuchukwu ya ụbọchị ụka nne, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘Divine Mercy Pastoral Area, Karu, dị n’Abuja. O kwuru sị: “Dịka ide ji ụlọ, ndị nne ga-agbazirili di na ụmụ ha iji kwalite ọnọdụ udo, eziokwu, ezi mmekọrịta na nghọta tọrọ atọ.”
Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ gaghị adị mfe gọọmenti imezuputacha atụmatụ ya, n’etinyeghị ụmụnwaanyị n’ihe a na-eme.


Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ndị na-akatọ gọọmenti gharakwa ichefu ịkpọku ndị Nigeria ka ha nyochaa akọnuche ha.


N’ihe gbasaara nsogbu na mbibi nke metụtarala ọtụtụ mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria, o kwuru na onye ọbụla, dịka onye ụka Kraịst, Muslim, na onye ọdịnala ga-ajụ ihe ọjọọ ma dabere n’ebere Chineke dịka a na-ebuso ọnọdụ enweghị ezi nchekwa agha.

GUO:  Achịbishọp Kaigama amaala ọkwa ụganị na Nigeria n'ihi enweghị ezi nchekwa ya anya

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here