A kpọọla òkù ka a kwụsị íbì ụmụ nwaayị úgwù

0
2

IBE nwaanyị úgwù (Female Genital Mutilation) bụ ihe ekwesịghị ekwesị, dịka ndị ọkacha mara si enye nkuzi.

  N’ihi nke a, òtù mba ‘United Nations Children’s Emergency Fund (UNICEF)’ ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo sitere na steeti ise, Osun, Oyo, Imo, Ekiti na Ebonyi, tinyere otu sitere mba ụwa dị icheiche na ụlọọrụ dị icheiche nke Gọọmenti Etiti etinyela ọnụ na ya bụ okwu, tụọ arò, ma nwee nkwekọrịta banyere usoro a ga-esi wètá ibe nwaanyị ugwu na njedebe n’ala Nigeria.

  Ndị ahụ ya bụ okwu gbasara, ma bụrụ ndị kpebiri ibu agha megide ya na-enwe mmetụta na ọdịnihu nwaanyị ga-enwe ihe icheakamgba n’ihi otu e si ebì nwaanyị ugwu na-aga n’ihu, site na nkwenye na omenala. Ha ekpebiela ịzọpụta ụmụnwaanyị, ma okenye ma ụmụakaị bụ ndị a na-emekpa ahụ ibì úgwù, n’ime obodo dị icheiche n’ihi omenala.

   Ha ji otu olu kpọọ òkù, ma buru n’uche inweta ndị Nigeria ga-adị ndè ise n’ọnụọgụgụ, ndị ga-enye aka buo agha megide ibì nwaanyị ugwu, n’igbasò isiokwu e wepụtara, bụ ‘Act to End FGM’.

   Ọgbakọ ahụ bụkwa maka ime ka ndị ndu ala anyị na ụwa niile gbaa gburugburu mata banyere nsogbu na ọghọm dị n’ibi nwaanyị ugwu n’ala anyị, ọkachasị na steeti ndị a kpọrọ aha, bụ ebe ya bụ ihe kacha njọ.

  N’okwu mmalite ya, Minista na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị n’ala Nigeria, Pauline Tallen gosiputara afọojuju o nwere maka etu ndị ahụ ya bụ okwu metụtara, ọkachasị ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo siri wee za oku, n’iwèta ihe gbasara ibi nwaanyị ugwu na njedebe.

  Oriakụ Tallen kọwara ibi nwaanyị ugwu dịka omenala a na-eme megide ụmụnwaanyị n’ụwa niile bụ nke e kwenyere na o megidere ikike dịịrị mmadụ ma bụrụ nke gbadoro mgbọrọgwụ na nkwenye na omenala. Ọ kọwara usoro ibi nwaanyị ugwu dịka ọnọdụ na-eweta nsogbu n’ime ahụ nwaanyị n’ịmụ nwa (repruductive organ).

   Ọ sị: “Sayensị egosipụtala na ibi nwaanyị ugwu enweghị uru ọ bara n’ahụike nwaanyị, kama na ọ na-eweta nsogbu n’ebe nwaanyị nọ.”

  Tallen kwuru na Nigeria kacha nwe ọnụọgụgụ ibi nwaanyị ugwu, n’ụwa niile n’ihi na ụmụnwaanyị ruru otu nde narị na iri na ise (115 million) n’ime ụmụnwaanyị dị otu nde narị na iri atọ (130 million) e biri ugwu n’ụwa gbaa gburugburu bụ ndị Nigeria.

   N’okwu nke ya, Minista na-ahụ maka ahụike, Dọkịnta Osagie Ehanire kpọrọ oku ka a gaa n’ihu n’isiokwu ahụ iji weta ọnọdụ ibi nwaanyị ugwu na njedebe n’ala Nigeria.

   Ndị ahụ sonyere nà mmemme mmemme kwupụtàrà mkpa ọ dị iwèta ọnọdụ ahụ na njedebe ma kọwaa mbọ ha maliterela ịgba, iji hụ na ọ bịara na njedebe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here