Ezinaụlọ ndị a tọ̀ọ̀rọ̀ na mwakpo ụgbọoloko Kaduna ebekuola Buhari ka ọ zọpụta ha

0
2
Ndị ezinụlọ ndị ahụ a tọọrọ ka ha na-eme ngagharịiwe ka a zọpụta ha

KA Ọ gachara abalị iri anọ na abụọ e ji tọrọ ndị njem n’ụgbọoloko ‘Nigeria Railway Corporation (NRC) AK9’ si Abuja aga Kaduna, bụ́ nke ndị omekome wakpòrò ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na asatọ; ọtụtụ ndị mmadụ na òtù dị icheiche ekwuola na ọ nweghị mbọ ọbụla a hụrụ anya ndị gọọmenti gbagoro kemgbe ahụ, iji hụ na a tọhapụrụ ndị ahụ na-eme njem a tọọrọ ụbọchị ahụ.

   Ndị ezinaụlọ ndị ahụ e ji eji rụtụrụ aka na Mee 9 mere ya abalị iri anọ na abụọ kpọmkwem e ji tọrọ ndị nke ha site n’ụgbọoloko ahụ a wakporo.

   N’ozi nke ha kụpụrụ, ụfọdụ ndị ndu ezinaụlọ ndị njem ahụ, Dọkịnta Abdulfatai Jimoh na Dọkịnta Ba’abba Muhammad kwuru na Minista na-ahụ maka njem (Minister of Transport), Maazị Rotimi Chibuike Amaechi, nọ nnọ na-ekwuputa mmasị o nwere ịzọ ọkwa Onyeisiala, n’enweghị mmetụta ọbụla banyere  ndị njem ahụ a tọọrọ.

 Ndị ezinaụlọ ahụ, bụ ndị nọ n’óké ihe mgbu na-ebokwa ndịisi ‘Nigeria Railway Coporation (NRC)’ ebubo na ha jụrụ ịgbara ha n’anwụ usoro mbọ ha na-agba iji zọpụta ndị ahụ, dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari siri nye ntụziaka.

   Ya mere, ha kpọkuru Gọọmenti Etiti ka ọ hụ na a zọpụtara ndị nke ha e ji eji ozigbo, n’enweghị nsogbu ọbụla; ma gakwaa n’ihu kwuo na ụgbọoloko Abuja—Kaduna agaghị amalite ọrụ wee ruo na e mezupụta arịrịọ mbụ ha, tinyere na a ga-ahụ na e hibere ezigbo ọnọdụ nchekwa kwesiri ekwesi, iji hụ na ndị njem ga na-eme njem ha n’udo.

Ndị ezinụlọ ndị ahụ a tọọrọ ka ha na-eme ngagharịiwe ka a zọpụta ha

   Ha kọwara na ọnọdụ ndị nke ha ahụ e ji eji jọgburu onwe ya.

  Ha sị: “O meela abalị iri anọ na abụọ ha ji nọrọ n’egwu, anaghị arahụ ụra, asaghị ahụ, yiri otu ákwà, n’ime oke anwu na mmiri ozuzo ma bụrụkwa ndị a hapụrụ na nsogbu gburugburu dị icheiche.

  “Nghasa ime mmụọ na nke elu ahụ na-esi n’ụdị ọnọdụ ahụ apụta bụ ihe adịghị mma ncheta. Ndị ahụ e ji eji gụnyere ụmụaka, ụfọdụ dị afọ atọ, ụmụnwaanyị dị ime, ụmụnwaanyị nke gụnyere agadi nwaanyị gbara afọ iri asatọ na ise na ndị ọzọ.

  “Ọtụtụ n’ime ha nwere ihe icheakamgba ahụike bụ nke mere na ha kwesịrị ịdị na-aṅụ ọgwụ kwa ụbọchị, ma bụrụ nke ha enweghịzi ike ime kemgbe ụbọchị ahụ a tọọrọ ha. Anyị nụrụ na otu n’ime ụmụnwaayị ndị ahụ dị ime amụọla nwa ya n’ime ọhịa.”

   Ha katọrọ ọnọdụ ahụ dịka nke jọgburu onwe ya n’ihi na ọ bụ n’ụlọọgwụ ka nwaanyị kwesịrị ịmụ nwa. Ha gara n’ihu kwuo na ụfọdụ ndị ahụ e ji bụ anya ezinaụlọ ha ji ahụ ụzọ, ebe ụfọdụ bụ ndị e ji nwunye ha, nne ha, ụmụnne ha ndị nwoke na nwaanyị, na ikwunaibe ha ndị ọzọ n’ime ọhịa. Ha rụtụrụ aka na ọnọdụ ahụ aghasaala obibi ndụ ezinaụlọ ndị o metụtara, n’ụzọ dị oke egwu.

  Ha sị: “Ụmụaka na-ebe akwa kwa ụbọchị, ajụjụ na-adị ha n’ọnụ bụ ‘olee mgbe Mummy na Daddy ga-alọta?’ “

  N’ime ihe niile, ha kọwara ọnọdụ ahụ dịka nke jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’ísì. Ya mere, ha kpọkuru Gọọment Etiti ka o mee ngwangwa zọpụta ndị ahụ, ka ha wee lakwuru ndị ezinụlọ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here