Gọọmenti Anambra chọrọ udo n’etiti ndị ọrụ na ndị obodo – Ifeanya

0
2
Ifeanya

KỌMISHỌNA na-ahụ maka mmanụ petroolu na ihe ndị a na-egwuputa n’ala (Petrouleum and Mineral Resources) na steeti Anambra, Ọkaiwu Anthony Ifeanya ekwuputala na gọọmenti Anambra dị njikere ikwàdò ndị ji ego achụ ego, tinyere ilebara anya na nsogbu ọbụla dapụtara n’etiti ha na ndị nwe obodo ha nọ na ya arụ ọrụ.

  Kọmishọna Ifeanya kwuputara nke a oge ndị ‘Ogwu-Aniocha Progressive Youth Association’ nke dị n’okpuru ọchịchị Ogbaru, na steeti ahụ kpọtụụrụ ya n’ụlọọrụ ya dị na ‘Jerome Udoji Secretariat’, Awka, banyere nsogbu dapụtara n’etiti ndị ọrụ na-egwuputa mmanụ na ndị obodo ahụ.

  O kwere nkwa na steeti ga-agbaso usoro udo wee lebaa anya na nsogbu ọbụla dị n’etiti ndị ji ego achụ ego na obodo ha nọ na ya egwuputa mmanụ, site n’usoro amụma iwu Petroleum Indurstry Act, iji wee mee ka ebumnobi ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo banyere steeti Anambra bịa na mmezu.

   Ọ gara n’ihu rụtụ aka na mkpa ọ dị ka ndị obodo ebe a na-egwupụta mmanụ na ndị ọrụ na-egwuputa mmanụ ebe ahụ na-ebi n’udo, n’ihi na nke ahụ ga-enye aka ime ka obodo ndị ahụ na-erita ihe ndị ha kwesịrị irita dịka ihe ndị e ji enyere ndụ aka, inweta ohere ọrụ, na ihe ndị ọzọ.

   Na mbụ n’okwu nke ya n’ebe ahụ, onyeisi ọchịchị obodo Ogwu-Aniocha, bụ Maazị Chidi Eze, ma bụrụkwa onye du ndị òtù wee bịa nyere mkpesa ka ụfọdụ ụlọọrụ si eji ihe dị n’ala ha arụ ọrụ n’akpọtụrụghị maọbụ nye obodo ha ihe ọbụla.

   N’ihi ihe ndị a, ha kpọkuru gọọmenti Anambra ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka, dịka ha kwukwara na ọtụtụ ndị obodo ha enweghịkwa ụlọ ebe obibi n’ihi na a gbara ụlọ ha ọkụ n’ihi nsogbu ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here