N’Anambra, Kọmishọna Ifeanya ehibela òtù ọrụ pụrụ iche

0
2
Ifeanya (nke atọ site n'aka nri), Obiogbolu (nke atọ site n'aka ekpe), Ezinando (nke abụọ site n'aka nri), na ndị ọzọ.

KỌMISHỌNA na-ahụ maka mmanụ petroolu na ihe ndị a na-egwute n’ime ala (Petroleum and Mineral Resources), bụ Ọkaiwu Anthony Ifeanya ehibela otu ọrụ pụrụ iche ga-ewepụta usoro na atụmatụ ọrụ ha ga-agbaso wee rụọ ọrụ n’ime afọ anọ n’ụlọọrụ ahụ. Otu ọrụ ahụ mmadụ asaa ahụ bụkwa ndị e nyèrè izuụka atọ iji wepụta ihe ha cheputara.

  Ọ dị ncheta na ụlọọrụ ahụ (Ministry of Petroleum and Mineral Resources) so n’otu n’ime ụlọọrụ ọhụrụ ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo kewapụtara na nsonso a.

  N’okwu ya oge ọ na-ehibe òtù kọmitii ahụ n’isi ọnọdụ ya dị n’ogige ‘Jerome Udoji Secreteriat’ dị n’Awka, Kọmishọna Ifeanya kwùrù na ndị nọ n’otu ahụ, nke Dọkịnta Alex Obiogbolu nọ n’isi ya, bụ ndị ma nke ekwe na-akụ n’ọrụ ahụ, nke gosiri na ha ga-eme nke ọma.

  Ọ kọwara na ihe a tụrụ anya n’aka ha bụ ịhazi usoro bụ ịgba ministịrị ahụ ga-agbaso rụọ ọrụ iji mezupụta ebumnobi nke ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo n’ebe steeti Anambra nọ. 

  Ọ gara n’ihu kwuputa na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi iwulite ministịrị ahụ n’ogoogo dị elu, ma sikwa na ọ na-agbasi mbọ kwalite akụaụba steeti ahụ ma mee ka ọ dị elu.

  N’okwu nke ya, onyeisioche òtù kọmitii ahụ, Dọkịnta Obiogbolu, ndị e nyèrè izuụka atọ maka ọrụ ahụ kwèrè nkwa na ha ga-emezuputa ihe e dunyere ha mee, iji hụ na steeti Anambra nwetara na-agawanye n’ihu

  Ndị so na kọmiti ahụ gụnyere Dọkịnta E. Ezinando, Ọkaiwu Richard Ezechukwu, Chiifu D. O. Ezendu, Dọkịnta Chris Ofokansi, na ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here